Take a fresh look at your lifestyle.

Onye nwere ọrịa shuga o kwesịrị ịra ‘mango’?

0 507

I jiri ụkwụ gagharịa n’ogbe gị ugbua, ị ga-agụkọ mmadụ ole na ole na-ere mango n’ogbe maka na ugbua bụ oge ya bụ mkpụrụosisi si amịpụta aghara aghara.

Ọ rịakwara ahụ ịhụ onye ga-asị na ya bụ mkpụrụosisi anaghị amasị ya.

‘Mango’ bụ otu mkpuruosisi na-atọwa ntị a naghị ahụkarị oge niile, ọ bụ mkpụrụosisi a na-agbara tiketị maka na anaghị ahụ ya oge ọbụla kwa afọ.

Mana ndị nwere ọrịa shuga ha e kwesịrị iso na-achọ ma na-ara ‘Mango’ aghara aghara?

Ngwa leekwa asịsị ndị mkpa.

Nke bụ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ụdịrị ọrịa shuga n’ụwa ugbua, e nweghikwa mmadụ abụo nwere ọrịa shuga nke ime ahụ ha bụ otu. Nke a mere ndị ọrụ ahụike ji adọ ndị mmadụ aka na ntị ọkachasị ndị bu ọrịa shuga, ka ha mata ọnọdụ ime ahụ ha ma ghọta etu ihe ndị ha na-etinye n’ọnụ si emetụta ha.

Ọ dịkwa mkpa ịkwuturu ndị ọrụ sayensi na-ahụ maka etu nrị si arụ ọrụ n’ime ahụ ndị mmadụ bụ ndị a na-akpọ ndị ‘Dietitian’ na Bekee.

Dịka oge a bụ oge mkpụrụ osisi ji amipụta ọkachasị ndị na-atọ ririri dịka ‘Mango’, ụnere (Banana) oroma nakwa ndị ọzọ, kedụ nke ndị nwere ọrịa shuga kwesịrị ịgbara ọsọ nakwa ndị nke ha kwesịrị ịgbakwuru?

Otu onye ọrụ ‘Dietitian’ aha ya bụ Rose Okafor kọwaara BBC Igbo na enweghi mkpụrụ osisi dị njọ kama ndị nwere ọrịa shuga kwesịrị ịgba mbọ na-elebanya nakwa na-ebelata aka n’iri mkpụrụ osisi ndị na-atọ ririri.

O kwuru: “Nke bụ eziokwu bụ na iri mkpụrụ osisi ndị na-atọ oke riri maọbụ nwee oke ihe ndị Bekee na-akpọ ‘Fructose’ anaghị akụda ahụike mmadụ. Mkpụrụ osisi dị mma iri.”

“Mana ighara irefe ihe na-atọ ụtọ oke dịkwa mkpa. Ririri mkpụrụ osisi na-atọ abụghị dịka nke shuga emepụtara emepụta. Dịka nke ndị na-adị n’ime mmanya ririri a na-ere n’ahịa.”

Ọ kọwara na ihe kacha emetụta ‘glucose’ nọ n’ime ọbara mmadụ bụ oke iri ụdịrị nrị ‘carbohydrate’ dịka oke iri akpụ, garị, ji, ọka wdgz.

O kwukwara na nke kacha njọ bụ iri maọbụ ịṅụ mmanye ndị a na-emepụta emepụta na-abụghi ndị nke ọnatarachi dịka mmanya ndị na-atọ riri nke a na-agba na mkpọ.

Nwaada Okafor kwuru:

“O bụghi iwu bụ na ị ga-akwụsị iri mkpụrụ osisi ndị a kama ọ ga-adị mkpa idobe akwụkwọ nri iji edetu ugboro ole na ole ị iriri mkpụrụ osisi ndị a.”

“Ụfọdụ ndị mmadụ na-eri mkpụrụ osisi ugboro ugboro, mana ndị ọzọ gazie iri ya ọkachasị iri nke nọ n’ahịa aghara aghara, ha erifee ya oke n’ihi o jupụrara ejupụta ma bara abara.”

Onye dọkịnta aha ya bụ Udodi Okoli kwuru na ihe ndị nwere orịa shuga nwereike izere bụ mmiri a pipụtara site n’ime ọtụtụ mkpụrụ osisi nke a na-akpọ “Juice’ maọbụ “Smoothies”.

O kwuru: “Ọ bụghị na ha dị njọ kama ọtụtụ mgbe, a na-ewepụ akpụkpa azụ mkpụrụ osisi ndị a nke nwere ihe dị mkpa a na-akpọ ‘roughage’, ma pịpụta ọtụtụ mmiri mkpụrụ osisi karịa ihe mmadụ nwereike ịdacha n’otu mgbe. Nke a nwereike ime ka mmadụ ṅụfee oke onye ahụ nwereike ịnụ.”

Dkt Okoli kwuru na nke a nwereike ime ka oke ‘Calories’ maọbụ ‘Carbohydrate’ ria oke elu n’ime ya bụ ihe ọṅụnụ ma metụta onye nwere ọrịa shuga.

Ndị mmadụ nwereike ịṅụfee mmiri apịpụtara site n’ime mkpụrụ osisi ma ghara ima na ha emefeela ihe oke

Na nchịkọta, ndị ọrụ ahụike abụọ a gbara ama na ihe ndị kacha mkpa n’okwu a bụ:

  • Ị ji nwanyọ na-eri ihe ọbụla ma ghara irefe ya oke.
  • ịbelata aka n’iri ihe ndị emepụtara emepụta ma gbanye na mkpọ ọkachasị nke ndị na-abụghị ihe ọnatarachi.
  • Ịgba mbọ na-elebanya etu mmadụ si eri ihe nakwa ugboro ole onye ahụ na-eri kwa ụbọchị, kwa izu nakwa kwa oge.
  • Ibelata aka n’ịṅụ oke mmiri apịpụtara na mkpụrụ osisi nke ewepụrụla anụ ahụ ya.
  • Ibelata aka n’ịta oke mkpụrụ osisi ndị amịkpọrọ amịkpọ n’ihi na ndị mmadụ nwereike ịtafe ya oke ma ghara ima dịka akị awụsa, ‘raisins’, ‘date’ nakwa ndị ọzọ.
  • Hụ dọkịnta gị maọbụ ndị ọru sanyesi na-ahụ maka etu nri si ahụ ọrụ n’ime ahụ mmadụ ma ọ bụrụ na ibu ọrịa shuga ma nwee ajụjụ banyere nri ọbụla.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *