Take a fresh look at your lifestyle.

Osinbajo esonyerela ndi ga azọ ọkwa onyeisiala

0 776

Osote onyeisiala ala Naijiria bụ,Ọkanmuta. Yemi Osinbajo ekwuputala nmasi ya iso zọọ ọkwa onyeisiala Naijiria n’ntuliaka nke afọ 2023.

Ọkanmuta. Osinbajo mere ka amata nkea n’ụtụtụ ụbọchi Mọnde site ihe onyonyo  national televisions.

Osote onyeisiala kwuru na ya arụkọla ọrụ yana President Muhammadu Buhari afọ asaa, bụ nke mere ka o nwe amamihe oga eji chie ala Naijiria dika onyeisiala.

“Amaram na ihe mere chineke jiri nyem ohere a bụ ka mu nwe ike chia ala Naijiria,ya mere nji chọ iso zọọ ọkwa onyeisiala na okpuru otu ndọrọndọrọ All Progressives Congress.

 “Nke ka nke , anyi ga agba mbo hu na enyere ohere oru maka ndi ntorobia ala anyi.

 “Ka anyi ruo Naijiria ebe onye si Nnewi ga ahụ onye si Gusau dika nwanne ya,ebe nwanyi si Warri ga ahụta nwanyi si Jalingo dika nwanne ya nwanyi,ebe onye obula ga enwe ohere dika ibe ya n’ala anyi.”

Na abali ụbọchi ụka ka onwere nzukọ ya na ụfọdu ndi Gọvanọ otu pati All Progessives Congress, APC, n’ebe obibi ya bụ, Akinola Aguda House dina Presidential Villa, Abuja.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *