Take a fresh look at your lifestyle.

Oke ikuku na mmiri ozuzo emebiela mpaghara ụfọdụ na Myanmar, Bangladesh

0 398

Nnukwu ikuku akụriela mpaghara ndị dị n’akụkụ osimiri na mba Bangladesh nakwa Myanmar n’ubochi Sọnde.

Ọdachi a akpọrọ ‘Cyclone Mocha’ bu oke mmiri ozuzo nakwa ikuku ike bụkwa nke a na-eche na ọ ga-akpata nnukwu ideimmiri.

A na-atụ egwu na ọdachi a ga-emetụta mpaghara Cox’s Bazar bụ ogige ebe ọnụọgụgụ ndị na-agba ọsọ ndụ kacha n’ụwa bi.

Akpọpụla ihe karịrị mmadụ 500,000 gaa ebe ọzọ iji zọọ ndụ ha, oke ikuku ahụ kụpụkwara ọkụ latrik nakwa ịntaneetị maka ọtụtụ ndị bi na mpaghara ebe o metụtara.

Onyonyo gosiri etu ikuku ahụ si butuo otu igwe ịntaneetị, nakwa etu ikuku si ebupụ elu ụlọ ndị mmadụ na mpaghara Sittwe nke Myanmar.

Ndị ntaakụkọ mba ahụ kwuru na osisi dagburu otu nwata nwoke dị afọ iri na ano na Rakhine Steeti.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *