Take a fresh look at your lifestyle.

Ezuola m ike nke ọma, adịla m njikere maka ọrụ dị n’ihu – Tinubu

0 445

Bola Ahmed Tinubu bụ onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke emere n’ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023, alọghachila Naịjirịa.
Tinubu mere njem n’ọnwa Maachị, izuụka olemole e mechara ntuliaka, gaa mba Fransị ka o zuo ike mgbagharị niile ọ gbagharịrị n’oge ntuliaka, dịka ndị ọrụ ya si kwuo.
Ndị enyemaka Tinubu kwukwara na ọ ga-esi ebe ahụ gaa mba Saudi Arabia isonye na njem ekpere nke ndị okpukperechi Islam a na-akpọ Hajj.
Mana ọ lọghachiri na Naịjirịa taa bụ ụbọchị 24 nke ọnwa Eprel, dịka ụgbọelu ya tụrụ ụkwụ n’ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n’Abuja n’ebe elekere anọ na ọkara nke ehihie.
N’ozi si n’aka onye enyemaka mgbasaozi ya bụ Bayo Onanuga, Tinubu kwuru sị: “Obi dị m ụtọ ịlọ. Ezuola m ike nke ọma. Ume adịla m ugbu a maka ọrụ dị n’ihu.”
Dịka Tinubu mere njem a, ọtụtụ malitere ịjụ ajụjụ gbasara ọnọdụ ahụike ya, dịka akụkọ fesara na ahụ esichaghị ya ike, mana ndị pati ya bụ All Progressives Congress kwuru na akụkọ ndị ahụ bụ ụgha.
“Gbachịnụ nkịtị n’asịrị na-efegharị ebe niile,” Tinubu kwuru, dịka Onanuga si depụta n’akwụkwọ ozi ya. “Agbasiri m ike nke ọma.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *