Take a fresh look at your lifestyle.

Kedụ ọghọm dị na mmadụ ịse Igbó maọbụ itinye ya na nri?

chigo

0 344

Kedụ ọghọm dị na mmadụ ịse Igbó maọbụ itinye ya na nri?

  • Ọ na-eri mmadụ ahụ ma sie ike ịkwụsị: Ọtụtụ ndị nnyocha sayensị ekwuola na igbó nwereike ịtọkụrụ mmadụ.Dịka Mazị Muobike si kwuo, ịkwụsị onye igbó tọkụụrụ ga-ebute nsogbu ụfọdụ dịka ọnọdụ mgbakasi ahụ, mmụọ ida mba,nsogbu ihi ụra, nakwa ndị ọzọ
  • O nwereike ịmetụta akọ na ụche nakwa ụbụrụ isi mmadụ: Ndị ọrụ ahụike kwuru na igbó nwereike ikpata obi mmapụ, ụjọ nakwa nkụja n’ahụ ụfọdụ.Dọkịnta Okoli kwuru na ọ nwereike ibute oke obi ịda mba nke a na-akpọ “Clinical Depression”.Igbó nwereike ikpalite mmadụ ịhụ ihe dịka ọ nọ na nrọ maọbụ ‘halucination’ na bekee, o nwekwara ike ịghasa akọnuche mmadụ.Dọkịnta Okoli kwukwara na isefe igbó oke nwereike ibute ọrịa isi mgbaka nke Bekee na-akpọ “schizophrenia”.
  • Ọ na-emebi akụkụ ahụ dị mkpa n’ime ahụ mmadụ: Maazị Muobike kwuru na ise ‘marijuana’ dịka anwụrụ nwereike butere mmadụ ọrịa obi, ọrịa kansa ngụgụ, nakwa ụkwara akwụsị akwụsị.
  • Marijuana joints ready to smoke and a pile of weed buds on black stone table. Close up background with drug details. Copy space left.
  • O nwereike iduba gị mkpọrọ: Dịka ‘marijuana’ bụ ihe iwu Naịjirịa machiri, ndị uweojii maọbụ ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọgwụ ike bụ ‘National Drug Law Enforcement Agency’ (NDLEA) nwere ikike ịnwụchị ndị na-ese ya, kpụpụ ha ụlọikpa ma tụọ ha mkpọrọ.
  • O nwereike ime ka achụọ mmadụ n’ọrụ: Ụfọdụ ụlọọrụ nwereike ịchụpụ mmadụ ma achọpụta na ọ na-ese ya bụ ọgwụ.Ụlọọrụ dị ịcheịche na-enyocha ndị ọrụ ha ịmata ma ha a na-aṅụ ọgwụ ike. E nyochapụta ọgwụ a na-ahụ mmadụ enwereike ịchụ onye ahụ n’ọrụ, dịka na ọrụ ndị agha, ndị egwuregwu, ndị ọkwọ ụgbọelụ nakwa ụgbọala, maọbụ ndị na-anya igwe e ji arụpụta ihe nke Bekee na-akpọ “Manufacturing Industries” wdgz
  • BBC

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *