Take a fresh look at your lifestyle.

INEC  kwuru na ha di njikere maka ntuliaka ọzọ na-enweghị nsogbu na Kano.

Jack Acheme, Kano dere ya na bekee.

0 299

INEC  kwuru na ha di njikere maka ntuliaka ọzọ na-enweghị nsogbu na Kano.

Kọmishọna na-ahụ maka ntuliaka nke steeti Kano, REC, nke otu Independent National Electoral Commission (INEC), Prof. Abdu Zango na-ekwu na  ha nwere nkwado zuru oke iji mee ntụli aka n’efu na ntuliaka steeti iri na anọ na mpaghara abụọ gọọmenti etiti dị na steeti ahụ.

Mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu n’isi ụlọọrụ INEC steeti ahụ, Zango kwuputara na e kesara ma ihe ndị na-emetụ n’ahụ ma ndị na-adịghị emetụ n’ahụ n’ebe a ga-eme ntuli aka na Satọde.

O kwuru na ntuliaka ahụ akwadoro ibido n’elekere 8:30 nke ụtụtụ wee mechie n’etiti  ehihie.

“Dịka ị na-ahụ, isi ụlọ ọrụ INEC na-eme mkpọtụ. Anyị ejirila ọrụ n’aka nke ukwuu. Ndị ọrụ ad-hoc enwetala ọzụzụ na ha dị njikere ịrụ ọrụ ha. Anyị emechiela nkọwa anyị na ihe omume ndị ọzọ, anyị dịkwa mma ịga,” ka ọ gbakwụnyere.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *