CBN na-akwado ikpochapụ akaụntụ na-ehi ụra.
Ụlọ akụ etiti Naịjirịa atụpụtala ka ụlọ akụ ndi nọọ n’okpuru ya ga-ebufe ego nke nọrọla ihe ruru afọ iri n’ime ngalaba aku nke a kporo “trust fund”.
Nke a dị n’ime akwụkwọ ntụzịaka mkpughe ewepụtara nso nso a na “Management of Dormant Accounts, Unclaimed Balances and Other Financial Assets in Banks and Other Financial Institutions in Nigeria”.
Akwụkwọ ozi so n’akwụkwọ mgbasa ozi ahụ kwuru na ntụzịaka a bụ n’ihi arịrịọ ndị ụlọ akụ na ndị ọzọ metụtara na CBN mere ka o dokwuo anya usoro e si ejikwa akaụntụ na-ehi ụra na ndị na-adịghị arụ ọrụ site n’aka ụlọ akụ dị na mba ahụ.
Leave a Reply