Take a fresh look at your lifestyle.

Ọkụ gbara akụkụ ahịa ‘Balogun’ dị na Legọs steeti

0 424

Ihe anyị ma maka ọkụ gbara n’akụkụ ahịa ‘Balogun Market’ dị na Legọs steetiIhe anyị ma maka ọkụ gbara n’akụkụ ahịa ‘Balogun Market’ dị na Legọs steeti

Ọkụ gbara akụkụotu ụlọ ebe ndị mmadụ na-echekwa ngwaahịa ha n’ahịa ‘Balogun Market’ dị na Legọs n’ụtụtụ Tuzde a.

Amabeghị ihe kpatara ọkụ a ugbua nke metụtaraụlọelu ogogo anọebe ndị mmadụ na-echekwa ngwaahịa ha n’ahịa a.

Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ Legọs steeti mechara bịaruo ebe ahụ awa olemole ka ya bụ ọkụ malitere ịgba.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Amodu Shakiru gwara ndi ntaakuko n’ehihe Tuzde na ha gbara mbọ mecha menyụọ ya bụ ọkụ dịka o kwuru na enweghi onye nwụrụ n’ihe ọdachị a dapụtara ebe ahụ.

N’okwu ya, ọ sị:

“Naanị mmadụ ise merụrụ obere ahụ n’ebe ahụ ọkụ gbara mana enyela ha ọgwụgwụ ngwa ngwa. Anyị na-eme nnyocha ịma ihe kpara ọkụ a.”

O kwuru na ha ga-ezipụta ozi zuruoke banyere ihe a mere ebe ahụ n’oge adịghị anya.

Ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ gwakwara onye ntaakụkọ garụrụ ebe ahụ okwu ebubo nke kwuru na ha ma na ọ bụ ndị mmadụ ma ụma mụnye ya bụ ọkụ iji megide otu agbụrụ ndị na-ere ahịa ebe ahụ.

Shakiru sara okwu a mgbe ya na ndi ntaakuko kwuru okwu ma kwuo:

“Ebubo na ọ bụ ndị mmadụ munyere ọkụ a achịtaghị aja ugbua n’ihi enwebeghị ihe akaebe gosiri nke a.”

O kwuru na agbanyeghi nke a, na ya bụ ebubo ga-eru ndị uweojii Legọs steeti ntị maka nnyocha zuruoke.

Nke a sokwa akụkọ ebubo ọzọ dapụtara n’oge ntuliaka 2023 mgbe ahịa Akere dịkwa na Legọs gbara ọkụ.

Ebubo olemole dapụtara na ụfọdụ ndị ma ụma mmunye ahịa ahụ ọkụ iji megide otu agbụrụ mana ndị uweojii steeti ahụ kụchapụrụ ya bụ akụkọ ma kwuo na enweghi ihe gosiri nke a dịka ha kwuru na ha na-enyocha ihe nwereike ịkpata ya bụ ọkụ.

A na-eche na ngwaahịa ndị mmadụ e che ruru nde kwuru nde gbara ọkụ n’ebe ahụ.

Nke a bụ maka na ọtụtụ ụlọ nọkọchara ọnụ na mpaghara ebe ahụ, ọzọkwa bụ na ọtụtụ ndị mmadụ nke ngwaahịa ndị mmadụ nọkwa n’ime ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *