Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe ị kwesịrị ịma banyere Sinetọ Abdullahi Adamu, onyeisi ọhụrụ pati APC

0 422
  • Ọ bụbu gọvanọ Nasarawa steeti site n’ụbọchị iri abuo na itolu  nke ọnwa Mee afọ 1999 ruo iri abuo na itolu nke ọnwa Mee afọ 2007, oche ọ zọtara oge ọ nọ n’okpuru pati People’s Democratic Party (PDP)
  • Ọ bụ sinetọ na-anọchite anya Nasarawa West n’ụlọomeiwu ukwu nke Naịjiria, o bu ụzọ zọta oche a n’afọ 2011, n’okpuru PDP
  • A mụrụ ya na Keffi dị na Nasarawa steeti, n’ụbọchị 23 nke ọnwa Julaị afọ 1946
  • Ọ gara akwụkwọ sekọndịrị na Government Technical College, Bukuru, ma gụọ mahadum na Kaduna Polytechnic
  • O si politeknik ahụ gawa mahadum na University of Jos, ebe ọ gụrụ maka Ịka Iwu
  • Ọ malitere ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n’afọ 1977
  • Ọ rụrụ dịka minista na-ahụ maka Ọrụ na Ụlọ site n’afọ 1995 ruo 1997
  • O so na ndị hibere PDP
  • Mgbe ọ chịchara dịka gọvanọ Nasarawa, e mere ya odeakwụkwọ ndị isi ahụrụ kwaba okpu nke PDP
  • N’afọ 2011, ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka na Naịjiria bụ EFCC kpụpụrụ ya ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka mere oge ọchịchị ya dịka gọvanọ
  • O si PDP wụbanye APC n’ụbọchị 29 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2014
  • A na-etu ya “Akwa (Bridge)”.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *