Take a fresh look at your lifestyle.

Gịnị bụ arụ ibe nne?(omenala na ewumewu)

chigo

0 1,017

Gịnị bụ arụ ibe nne?

“Naanị mkpi bụ anụ rụchara ala bee nne ya”. Nke a bụ okwu Maazị Nnabuife bụ onye ọkachamara n’okwu agụmagụ na omenaala Igbo na mahadum legọs bụ onye BBC igbo kpọrọ ka ọ kọwaa okwu a.

O kwuru na arụ ibe nne gụnyere mmekọ aramara ọbụla mere n’etiti nwanne otu nne na otu nna, nwanne otu nna na-abụghị otu nne, nwanne otu nne na-abụghị otu nna, nne na nwa maọbụ nna na nwa .

N’akụkụ nke ya, Nze Duruagwụ gwara anyị na arụ a gụnyekwara mmekọ aramara dị n’etiti otu ọbara, otu ezi, otu agbụrụ dgz. O kwuru na ụmụnne ekwesighi inwe mmekọ aramara ma ọbụrụ na ha erughi agbụrụ isii n’etiti ha.

O kwukwara na o nwere obodo ndị anaghị alụkọ onwe ha maka na omenala kwenyere na ha bụ ụmụnne.

Ihe Igbo na-akpọ ụdịrị mmekọ ahụ bụ ibe nne. Onye ọbụla nọ n’ime ọgbakọ a nwere ụdịrị mmekọ a, Igbo na-ahụta ya na ha emeela arụ megide ala, ya bụ ‘arụ ibe nne.’

Mana nke bụ eziokwu bụ na ọ bụghị naanị ndị igbo na-ahụta ya ka ihe ọjọọ.

BBC

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *