- Nne ga na-enye nwa ya nwaanyị ihe ga-eme ka mmiri ara ya gbaa ọfụma
- Nne ga na-esiri ya nri ndị ga-eme ka ahụ ya gbakee ọfụma
- Nne ga na-ama ya mmiri ọkụ n’afọ na ebe ndị ọzọ ọ chọrọ, ma tekwaa ya ihe ga-ekpo ya ahụ ọkụ (robb, aboniki)
- Nne ga na-enye nwata ọhụrụ nri, saa akwa ya ma saa ya ahụ
- Ọ ga-adọtịkwa nwa ọhụrụ ahụ, ma hịa ya aka n’ahụ ọfụma
- Ọ ga na-ahụ na nwa ya nọ ala n’elu bọketị awụnyere mmiri ọkụ na nnu na ọgwụ eji achụ nje, nke ga-eme ka ọbara ọjọọ nwee ike gbapụta
- Ọ ga na-ekekpa ya afọ ka o nwee ike taa ma hara etu ọhabu tupu ọ dị ime
- Nne ga na-agba nwa ya nwaanyị ume maka na ya na onwe ya anọọla n’ọnọdụ ahụ mbụ
- Ọ ga na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ dị n’ụlọ dịka ihazi ụlọ na isi nri ezinaụlọ na-eri
Prev Post
Leave a Reply