Take a fresh look at your lifestyle.

Ulọikpe amaala mmadụ atọ ikpe ọnwụ maka ịwakpo nwata akwụkwọ mahadum na Naịjirịa

0 902

Otu ụlọikpe ukwu dị n’Ilorin, Kwara Steeti, amaala mmadụ atọ ikpe ọnwụ dịka e kpebiri na ha wakporo nwata akwụkwọ aha ya bụ Blessing Omowumi n’ike ma mechaa gbuo ya.

Ọkaikpe Yusuf Adebayo nyere mkpebi a n’ụbọchị Tuzde n’ebubo e boro ụmụ okorobịa asatọ maka izu ohi, ịwakpo nwaanyị n’ike nakwa igbu mmadụ.

Ndị a mara ikpe ọnwụ bụ Abdulazeez Ismail, Ajala Oluwatimileyin na Oyeyemi Omogbolahan, dịka ọkaikpe Adebayo kwuru na a ga-eji ụdọ kwụgbuo ha.

Ụlọikpe ahụ tọhapụrụ mmadụ atọ n’ime ndị e boro ebubo ahụ, ha bụ Abdullateef Abdulrahman, Daudu Bashir Aderayo na Akande Taiye Oladoja, ma kwuo na aka ha dị ọcha.

Mmadụ abụọ ndị ọzọ ka a tụrụ mkpọrọ afọ atọ maka izu ohi.

Ụmụ okorobịa niile ndị e boro ebubo a bụchakwa ụmụ akwụkwọ na Mahdau Ilorin.

Gọvanọ Kwara Steeti bụ Abdulrahman Abdulrazaq kwuru sị: “Ụdị omume ọjọọ a abụghị ihe anyị ga-anabata n’obodo anyị. Anyị niile kwesịrị ijikọ aka ọnụ ma buso agwa ọjọọ dị otu a agha.”

Etu mwakpo ahụ si mee

Ndị uweojii kwuru na ọ bụ nwanne nwaanyị Blessing Omowumi hụrụ ozu nwanne ya n’ime ụlọ ha oge ọ si ọrụ lọta n’ụbọchị ahụ, ọ hụkwara na e kechiri ya aka.

Ihe a mere n’ụbọchị abụọ nke ọnwa June afọ 2021.

Ndị ekperima ahụ hapụkwara otu akwụkwọ ozi n’ebe ha nọrọ gbuo nwa agbọghọ ahụ nke e dere “Unilorin anaghị agbaghara”.

Otu n’ime ndị ezinụlkọ nwa agbọghọ ahụ e gburu aha ya bụ Omolara Kuteyi, gwara ndị ntaakụkọ na ọ tụrụ ha n’anya maka na ụfọdụ ndị so gbuo nwa ha nwaanyị bụcha ndị ha ma nke ọma.

“Oge a kpọbatara ha n’ụlọikpe, anyị amaghị na ọ bụ ha mere ihe ahụ. Atọ n’ime ha bụ ndị anyị na ha bi n’otu okirikiri. Ụfọdụ n’ime ha bụkwa ụmụ akwụkwọ na mahadum ahụ,” Kuteyi kwuru.

Ọ kọwara na ọ bụ site n’ekwentị nwaagbọghọ ahụ e gburu egbu ka ndị uweojii si nwụchie ndị kpara arụ ahụ.

“Ha weere ekwentị ya resi onye ọzọ, ọ bụ site n’ekwentị ahụ ka ndị uweojii si chọta ha,” ka o kwuru.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *