Take a fresh look at your lifestyle.

Njem ụgbọ oloko Abuja-Kaduna ga-amalite ọzọ n’abali ise nke Disemba

0 518

Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka njem ụgbọ oloko bụ Nigeria Railway Corporation ekwuola na njem ụgbọ oloko Abuja-Kaduna ga-amalite ọzọ n’ụbọchị Mọnde, abalị ise nke Disemba 2022.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Fidet Okhiria kwuru nke a site n’akwụkwọ ozi o wepụtara n’ụbọchị Satọde.

Cheta na njem ụgbọ oloko a kwụsịburu dịka ndị ekperima bandit wakporo ya n’abali iri abuo na asato nke ọnwa Maachị afọ a.

Mmadụ asatọ nwụrụ na mwakpo ahụ ebe ndị ekperima ahụ tọọrọ ihe ruru mmadụ iri isii na abuo, ọtụtụ n’ime ndị a atọọrọ nọgidere n’aka ndị ekperima ahụ ruo ụbọchị isii nke ọnwa Ọgọst 2022.

Okhiria kwuru na dịka njem ga-amalite ọzọ n’okporo ụgbọ oloko a, ndị mmadụ ga-enwe ike ịgbata tiketi ha site n’ọbaozi ịntanetị ndị NRC, maọbụ site n’ịdọtụ akụrụngwa ‘mobile app’ n’ekwentị ha.

Ịgbata tikeeti ga-amalite n’elekere asatọ nke ụtụtụ taa bụ Sọnde.

Ụgbọ oloko nke si Kaduna aga Abuja ga-ahapụ ọdụ ụgbọoloko dị na Rigasa, Kaduna, n’elekere asatọ nke ụtụtụ ụbọchị Mọnde, ebe ụgbọoloko nke ga-esi Abuja gawa Kaduna ga-ahapụ ọdụ ụgbọoloko dị n’Idu, Abuja ma o jiri ọkara gafee elekere itoolu nke ụtụtụ Mọnde.

Onye ọbụla chọrọ iso ụgbọoloko a eme njem ga-enwerịrị akara njirimara ‘National Identity Number’ bịakwa nwee tiketị tupu ekwe ya ka ọ banye.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *