Take a fresh look at your lifestyle.

Lee ihe Peter Obi sara Chukwuma Soludo maka ihe ọ gwara ya

0 487

Aka chịburu Anambra Steeti bụ Peter Obi asaala ihe aka na-achị Anambra steeti ugbua bụ Chukwuma Soludo kwuru banyere ya.

Soludo kwuru na Peter Obi agaghị emeri ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ọ na-azọ notu ‘Labour Party’, ma kwukwaa na ọtụtụ ebe Peter Obi tinyere ego Anambra steeti oge ọ bụ Gọvanọ, achịtaghị aja ọbụla ugbua.

Mana Peter Obi kwuru na ya gbalịrị ikw ya oge ọ bụ gọvanọ ime ihe ya chere ga-ewetara Anambra steeti ọganihu.

Obi kwuru nke a n’ọgbakọ pụrụ iche e nwere n’ụlọakwụkwọ ‘Lagos Busines School’ taa bụ Tuzde.

“Ugbua, Chukwu enyela Soludo ohere imetọpụ ihe ndị ahụ ọ sị na mụ emetaghị nke ọma, ya mezie ya ka ọ kara Anambra steeti mma,” Peter Obi kwuru.

Gbasara ebe o tinyere ego Anambra steeti

Obi kwuru na ihe dị n’itinye ego n’otu ụlọọrụ maọbụ nke ọzọ nke bekee na-akpọ ‘investment’ bụ mkpebi ya mere iji nyere Anambra steeti aka.

“Oge ụfọdụ ebe i tinyere ego nwereike gbalie, oge ụfọdụ, o nwereike gbatuo, mana ọ pụtaghị na ụlọọrụ ahụ emechiela kpam kpam,” Peter Obi kwuru.

“Anaghị m ekwu nke a iji saa okwu nwanne m nwoke bụ Chukwuma Soludo kwuru banyere oge m chịrị Anambra steeti.”

“Nwanne m nwoke bụ nwanne m nwoke, ihe ndị mụ emetaghị, ọ ga-enwe ohere imetọpụ ya.”

“Gọọmentị anaghị agwụ agwụ. Emeela m ole m nwereike dịka onye ọzụahịa m bụ, ya onwe ya ga-emekwa nke ya dịka ọkammụta ọ bụ. Ha niile bụ ka Anambra na-aga n’ihu.”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *