Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ikpe Nnamdi Kanu si aga taa n’Abuja

0 496

Ikpe dị n’etiti Nnamdi Kanu – onyeisi ndị otu na-achọ nnwereonwe bụ Ipob – na goomentị Naịjirịa, ga-amalitekwa ọzọ n’ụtụtụ Wenezde a n’ụlọikpe ukwu dị n’Abuja.

Cheta na ọ bụ n’ụbọchị Tuzde ka ikpe ahụ malitekwara ọzọ, nke mbụ ya n’afọ ọhụrụ a bụ 2022.

Gọọmentị Naịjirịa ji Nnamdi Kanu eji, na-ekpe ya ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwasa gọọmentị Naịjirịa.

A nwụchiri Mazị Kanu na mba Kenya n’ọnwa Jun afọ 2021, ma kpụlata ya Naịjirịa ebe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ ndị ọrụ nchekwa nzuzo bụ DSS.

N’ebe ahụ ka e si akpụta ya ụlọikpe ka ọ zara ọnụ ya n’ebubo niile e boro ya.

Ihe mere n’ụlọikpe n’ụbọchị Tuzde

Nnamdi Kanu n’ụlọikpe Abuja n’abali iri na asatọ Jenuwari afo, 2022

Dịka ya bụ ikpe malitere ọzọ, gọọmentị Naịjirịa wepụtara ebubo asatọ ọhụrụ bụ nke ha tinyere n’ebubo asaa ha boburu Nnamdi Kanu.

Nke a welitere ọnụọgụgụ ebubo ha boro ya ruo iri na ise.

Ndị ọkaiwu gọọmentị bụ ndị ekpe Nnamdi Kanu ikpe

Ụfọdụ ihe ndị dị n’ebubo ọhụrụ ahụ gụnyere:

  • Na Nnamdi Kanu nyere iwu ka e gbuo ndị ọrụ nchekwa na ndị ezinụlọ ha
  • Na Kanu nyere iwu ka e mebie ụlọọrụ gọọmentị dị icheiche
  • Na Kanu kpalitere ndị mmadụ ka ha kụsaa ntuliaka Anambra steeti
  • Na Kanu jalitere ndị mmadụ ka ha gbaa ụgbọala na ụlọọrụ gọọmentị Legọs ọkụ
  • Na Kanu jalitere ndị mmadụ ka ha wakpoo obi eze Oba nke Legọs ma gbaa ya ọkụ
  • Na ọ manyere ndị mmadụ ka ha ghara ịpụta ezi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ… dgz

Mana oge ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu hụrụ ebubo ọhụrụ ndị a, ha kwuru na ha enwetaghị ya n’oge iji nwee ohere lezie ha anya ma mara ihe ha ga-asa maka ya.

Nke a mere ka ọkaikpe Binta Nyako bugharịa ikpe ahụ ka ọ bụrụzie taa bụ Wenezde, iji nye ohere ka ndị ọkaiwu Kanu lebanye anya n’ebubo ọhụrụ ndị ahụ.

Ọkaiwu Mike Ozekhome, Ifeanyi Ejiofor, na Maxwell Okpara

Mana ndị ọkaiwu Kanu nyekwara mkpesa gbasara etu ndị DSS si akpaso Kanu agwa n’ụlọ mkpọrọ ha.

Nke a mere ka ọkaiwu Nyako nye iwu ndị a:

  • Ndị DSS ga-enye Kanu uwe ọhụrụ ka ọ gbanwee uwe nke ọ na-eyi kamgbe ndị uweojii nwuchiri ya n’ọnwa June
  • Ndị DSS ga-enye Kanu ohere ka ọ na-emegharị ahụ (exercise) n’ime ụlọ mkpọrọ
  • Ndị DSS ga-eme ka Kanu nwee ọnọdụ dị mma n’ụlọ mkpọrọ

Etu ikpe Nnamdi Kanu si ruo ebe ọ nọ ugbua

Ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja yigharịrị ikpe Kanu ruo taa bụ Jenụawarị 18, 2022 n’abali iri abuo n’otu Ọktoba afo, 2021.

Cheta na mgbe mbụ Kanu gbara n’ihu ụlọikpe ukwu dị n’Abuja bụ n’ọnwa Julai ka anwụchịchara ma tinye ya n’ụlọmkpọrọ ndị Department for State service (DSS) n’ọnwa Juun.

Ọkaikpe Binta Nyako yighariri ikpe ahụ buga ya ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba, 2021, dịka ndị otu Ipob zipụtara ozi iwu onye nọrọ n’ụlọ maka nkwanye ugwu ya bụ ikpe.

Ikpe nke taa bụ abali iri na asato nke onwa Jenụwarị, 2022, ga-adọti ruo iri na itoplu nakwa iri abuo  nke ọnwa a bụ ụbọchị a na-eche na a ga-ekpebi ikpe ya.

Cheta na gọọmentị etiti Naịjiria kwuputere na ha si mba Kenya nwụchie ma kpọghachite Kanu na Naịjirịa n’ọnwa Juun nke afọ 2021.

Ndị otu Ipob nakwa ọtụtụ mmadụ katọrọ etu e si nwụchie nwaamadi ma na-ekwu na iwu mba ofesi akwadoghi ihe gọọmenti etiti mere.

Mana gọọmenti etiti na-ekwusi ike na Kanu gbara ọsọ ka ikpe mbụ o nwere ka na-aga ihu n’afọ 2017.

Onye bụ Nnamdi Kanu?

Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya (Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor)

Nwannekaenyi “Nnamdi” Kanu chọpụtara otu Indigenous People of Biafra n’afọ 2014.

Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ kewara ma hibe mba a kpọrọ Biafra.

Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n’afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra steeti mana ka alụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde , atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.

Kanu malitere redio Biafra n’afọ 2009 nke e hibere na London ma na-ezipu ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.

Ọ gara mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) tupu ọ gawa London.

Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ.                                                                                       

Igwe C./BBC

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *