Take a fresh look at your lifestyle.

Prezidenti Buhari nwere nzukọ yana ndi APC chọrọ izọ ọkwa onyeisiala

0 686

Onyeisiala Naijiria bụ,Muhammadu Buhari na enwe nzukọ ya ndi nile chọrọ izọ ọkwa onyeisiala n’otu pati All Progressives Congress APC.

Nzukọ a bụ nke were ọnọdụ na Presidential Villa dina Abuja,nke ndi bara ọgbakọ a gunyere onye isioche otu pati APC bụ, Abdullahi Adamu na mmadu iri abụọ na atọ bụ ndi chọrọ izọ ọkwa onyeisiala na okpuru otu ndọrọndọrọ APC.

Nkea bu iji kwado maka ntuliaka imeụlọ nke otu ndọrọndọrọ APC ga adi n’ụbọchi Mọnde ruo n’ụbọchi Wenezde.

Ana ele anya na mgbe nzukọ a gachara n’ọnụ ọgụgụ ndi nwere nmasi izọ ọkwa onyesislala na otu pati a ga agbatu.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *