Take a fresh look at your lifestyle.

Mmepe EBIC Maka ụmụ akwụkwọ Naijiria imebe oru

Chigo deziri ya na Igbo

0 53

Mmemme a kpọrọ Entrepreneurship, Innovation and Business Incubation Certification (EIBIC), nke Gọọmenti Naijiria malitela nke ebumnuche ya bụ ime ka ụmụ akwụkwọ Naijiria ghọọ ndị na-emepụta ọrụ kama ịbụ naanị ndị na-achọ ọrụ, ma kwalite uto akụ na ụba dabere na mmepụta ọhụrụ.

Onye Minista Maka Mmụta, Tunji Alausa, kwuru nke a mgbe ọ na-ekpughe mmemme ahụ na Abuja,

Alausa kwuru na atụmatụ a bụ nnukwu mgbanwe n’usoro agụmakwụkwọ, na-elekwasị anya ugbu a na ịzụlite azụmahịa, mmepụta ọhụrụ, na mmepe ụlọ ọrụ.

O kọwara mmemme ahụ dịka azịza dị mkpa nye mgbanwe ụwa nke na-aga n’ihu, ebe teknụzụ na-agbanwe ụlọ ọrụ dị iche iche ma na-eme ka ohere ọrụ ọdịnala na-ebelata.

“Oge a abụghị naanị mmalite mmemme, kama ọ bụ mmalite usoro ọhụrụ n’agụmakwụkwọ Nigeria.
“Mmemme a ga-eme ka ndị ntorobịa anyị si n’ịbụ naanị ndị na-amụta gaa bụrụ ndị na-emepụta ihe ọhụrụ, ma site n’ịbụ ndị gụsịrị akwụkwọ gaa bụrụ ndị na-ewulite mba,” ka o kwuru.

O toro mahadum, National Universities Commission (NUC), Tertiary Education Trust Fund (TETFund), ndị mmekọ ụlọ ọrụ, na ndị isi ụlọ ọrụ mmụta azụmahịa maka nkwado ha nyere atụmatụ a.

Dị ka o si kwuo, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị ntorobịa Nigeria bụ nnukwu uru ma bụrụkwa nnukwu ọrụ n’aka gọọmenti.

O kwusiri ike na usoro agụmakwụkwọ ọdịnala naanị ya agaghịzi enwe ike idozi nsogbu enweghị ọrụ na nsogbu inweta ọrụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *