Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọikpe enyela ikike ka a nwuchie Onyeisi otu ngalaba PDP bụ Turaki

0 111

Ọkaikpe Peter Kekemeke nke Ụlọikpe Ukwu nke Isi Obodo enyela ikike ka a nwuchie Onyeisi otu ngalaba pati PDP bụ Tanimu Turaki.

Ọkaikpe a wepụtara akwụkwọ ikike ahụ mgbe Turaki jụrụ ịbia n’ụlọikpe ka a gụọrọ ya ebubo ya.

Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa boro Turaki ebubo inye ndị uweojii ozi ụgha.

N’ụbọchị ikpe ahụ, onye Ọkaiwu na-ekpe ikpe, bụ Usman Rabiu, sịrị na ihe a bịara n’ụlọikpe n’ụbọchị ahụ bụ ka Turaki zaa ebubo a boro ya.

Rabiu kwuru na Turaki abịaghị n’ụlọikpe n’agbanyeghị na e nyere ya akwụkwọ ebubo nakwa akwụkwọ ọkwa ikpe, nke na-agwa ya maka usoro ikpe nke ụbọchị ahụ.

O wee jiri ikike dị na Nkebi nke narị atọ na iri itoolu na isii, nkewa okwu nke abụọ (396(2)) nke Iwu Na-ahụ Maka Ikpe Mpụ (ACJA) nke afọ 2015 mee ihe.

Ọkaikpe Kekemeke kwuru na dịka ọ dị n’ihe e dere n’iwu ACJA nke afọ 2015, mgbe onye a na-ebo ebubo maara na o nwere ikpe, ma jiri aka ya jụ ịbịa, iwu kwesịrị ekwesị a ga-ewepụta bụ ikike nnwuchi iji hụ na a kpọtara onye ahụ ka ọ zaa ebubo a boro ya.

Ọkaikpe ahụ kwuru na akwụkwọ onye a na-ebo ebubo gbara iji rịọ ka a kagbuo ebubo ahụ erubeghị oge a ga-atụle ya.

O kwukwara na a ga-atụle arịrịọ ahụ naanị mgbe onye a na-ebo ebubo zachara ebubo e boro ya.

O wee nye iwu ka a nwuchie Turaki iji manye ya ịbịa n’ụlọikpe ma zaa ebubo ndị e boro ya.

Ọkaikpe Peter Kekemeke mechara yigharịa ikpe ahụ ruo n’ụbọchị 22 nke ọnwa Eprel maka ịgụrụ Turaki ebubo ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *