Ịran enyela ugbọmmiri anyi ikike isi n’ụzọ mmiri ‘Strait of Hormuz’ gafee – Praịm Minista Maleshịa Ịran enyela ugbọmmiri anyi ikike isi n’ụzọ mmiri ‘Strait of Hormuz’ gafee – Praịm Minista Maleshịa
Ebe foto si, Getty Images
Praịm Minista mba Maleshia bụ Anwar Ibrahim ekwuola na ndị ọrụ gọọmentị Ịran enyela ụgbọmmiri obodo ya ikike isi n’ụzọ mmiri ‘Strait of Hormuz’ gafee.
O kwuru nke a na Tọzde ma sị na ya na mba Ịran, Egypt, Turkey na mba ndị ọzọ nọ na mpaghara ahụ nwere nzukọ iji nweeike inweta nkwekọrịta.
Maleshịa esorola obodo ndi kwupụtara na ụgbọmmiri ha ga na-agafe n’ọnụụzọ mmiri a.
South Korea, India, China na Japan bu obodo ndị ọzọ nwetara ikike isi n’ụzọ mmiri a dị mkpa gafee.

Leave a Reply