Ụlọọrụ na-ebu agha emegide mpụ na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) nakwa otu jikọtara ndị gụrụ banyere nchekwa a na-akpọ “Alumni Association of the National Institute for Security Studies, AANISS” ekwekọtala na ha ga-ejikọ aka ọnụ megide ị ji ego azụta vootu.
EFCC na otu AANISS mere ka a mata nke a n’Abuja dịka ha zutechara n’isi ụlọọrụ EFCC.
Onyeisi AANISS bụ Mike Ejiofor kwuru na atụmatụ ahụ ga-enyere aka gbochie nrụrụaka na ntulịaka ọkachasị ị jiri ego azụta vootu ma too mbọ niile ụlọọrụ EFCC na-agba maka nke ahụ.
Olukoyede bụ onyeisi ụlọọrụ EFCC kwetere na ọ bụ ọrụ ha ibuso agha megide ndị ji ego azụta vootu ma kwuo na ha na-eme ike ha banyere ya.
Leave a Reply