Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ ọrụ EFCC chọrọ inwuchi Sinetọ Okorocha

0 459

Aka chiburu Steeti Imo bụ Rochas Okorocha etiela mkpu na ndị ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) wakporo ụlọ ya dị n’Abuja n’ụbọchị Tuzde.

EFCC wakporo ụlọ ya dị na mpaghara Maitama Abuja n’ehihie Tuzde dịka na na-achọ ịnwuchi ya.

Mgbe Okorocha na-aza ekwentị ndị Channels TV kpọrọ ya, ọ katọrọ agwa ndị ngalaba EFCC kpara ma ṅụọ iyi ịnọgide n’ime ụlọ ruo mgbe ọ ga-ahụ akwụkwọ ikike sị ka a nwụchie ya.

N’okwu ya “e ji m n’agbụ ebe a, ajụọla m ha ma ha ji akwụkwọ ikike ịnwụchi m. Ana m akwado ịga mee nyocha maka ọkwa onyeisiala m na-azọ”.

“Amaghị m ihe na-eme; Ọ bụ ihe ọjọọ na ihe a na-eme ebe a. Aga m anọ ebe a ruo mgbe m matara ihe ha na-achọ, a chọrọ m ịhụ akwụkwọ ikike sịrị ha nwuchie m”.

Ihe onyonyo si n’ụlọ Okorocha bụ nke dị na soshal midia gosiri ebe ndị EFCC juru na mbara ezi ụlọ Okorocha.

Ha siri ọnwụ ka Okorocha nyefee ha onwe ya maọbụ zaa oku ha kpọrọ ya kamgbe bụ nke ọ na-achọghị ịza.

Ndị EFCC jiri ihe dochie ọnụ ụlọ Okorocha nke gbochiri ụfọdụ ndị ntaakụkọ ịbata na ndị ọzọ ịbata n’ime ụlọ ya.

Ha mechara sị na chọrọ ịgbaka ọnụzọ ụlọ Rochas ebe ọ jụrụ ịpụta ka ha nwuchie ya.

Kedụ ebubo EFCC na-ebo Okorocha?

Akụkọ banyere ụlọọrụ EFCC na Rochas Okorocha malitere mgbe ọ rituru n’ọkwa dịka gọvanọ Imo Steetị n’afọ 2019.

Ha boro ya ebubo izu ego gọọmentị Imo Steetị mgbe ọ nọ n’ọchịchị ma kpachie ọtụtụ ụlọ Rochas ne ezinaụlọ nwe.

N’ọnwa Jenụwarị afọ 2022, ụlọọrụ EFCC boro Okorocha ebubo ọhụrụ ruru iri na asaa nke ọnụego ya bụ ijeri naịra abụọ na ụma (N2.9bn) ma kpụpụ ya n’ụlọikpe ukwu dị n’Abuja.

Ha sị na Rochas na ndị ọzọ gụnyere onye pati APC bụ Anyim Nyerere Chinenye, ụlọọrụ ise gbakọtara aka ma zuo ego ọha.

Ụlọorụ ndị a bụ Naphtali International Limited, Perfect Finish Multi Projects Limited, Consolid Projects Consulting Limited, Pramif International Limited, na Legend World Concepts Limited.

Ha sị na ego a ha zuru megidere iwu na-achị mbupu na ịtụmgbere ego na Naịjirịa nke afọ 2011 (Money Laundering Act 2011).

EFCC wepụtara ebubo ọhụrụ ngwa ngwa Rochas kwupụtachara mmasị ya ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *