Onyeisiala Bola Tinubu esila Abuja gawa mba United Kingdom ibido njem nke ụbọchị abụọ. Eze Charles III na nwunye ya Queen Camilla nabatara ha.
Tinubu na nwunye ya (Remi Tinubu) siri n’ọdụgbọelu Abuja pụta n’elekere 10:00 nke ụtụtụ ụbọchị Tuzde.
Ndị isi ala Naịjirịa kọwara njem a dị ka akụkọ ihe mere eme maka na ọ bụ onye isi ala Naịjirịa gara nleta steeti mbụ kemgbe 1989, na nke mbụ n’okpuru ọchịchị Eze Charles, na ọ bụkwa nke mbụ a ga-anabata ya na Windsor Castle.
A na-atụ anya na Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ga-aga mba ‘United Kingdom’ n’ụbọchị Tuzde 17 Maachị 2026.
Njem ahụ bụ maka nzukọ ga-adị n’etiti ya na ndị ndu mba Briten gbasara ịkwalite mmekọrịta ha na Naịjirịa n’ihe gbasara akụnaụba.
Njem ọrụ ya ga-amalite n’ụbọchị Wenezde 18 Maachị 2026, mgbe Tinubu na nwunye ya bụ Oluremi Tinubu ga-aga leta Eze Charles nke atọ na ‘Windsor Castle’.
Tinubu ga-abụ onyeisiala Naịjirịa nke ise Eze mba Briten ga-anabata, ma bụrụkwa onye nke mbụ a ga-ele ọbịa na Windsor Castle, n’ihi na ọ bụ na Buckingham Palace ka a nọọrọ nabata ndị ndu Naịjirịa pụrụ apụ.
Nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nke onyeisiala n’ihe gbasara mgbasaozi bụ Temitope Ajayi kwuru n’otu ozi o wepụtara, na njem ahụ ga-atụle uche na mmekọrịta dị n’etiti Naịjirịa na mba UK.
Leave a Reply