Take a fresh look at your lifestyle.

Bishọpụ achụọla ụkọchukwu Katọlik na-azọ Gọvanọ na APC ọsọ

0 651

Bishop ụka Katọlik nke dayọsis Gboko bụ William Avenya enyela Fr Hyacinth Alia ntaramahụhụ site n’ịkwụsị ya ọrụ dịka ụkọchukwu.

Nke a bụ maka na Fr Hyacinth Alia sonyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressives Congress (APC) ma gbata akwụkwọ iso zọọ ọkwa Gọvanọ nke Benue Steeti.

N’akwụkwọ ozi si n’aka Bishọpụ Avenya, ọ kọwara na o megidere iwu ụka Katọlik onye ụkọchukwu ịbanye otu ndọrọndọrọ ọchịchị.

O kwukwara sị na nkwụsị ọrụ a ga-adịgide ruo mgbe ụkọchukwu ahụ tụgharịrị ma kwụsị ịzọ ọkwa a ọ na-azọ.

Okwu a kpụ n’ọnụ

Fr Alia ịbanye otu APC ma na-azọ ọkwa gọvanọ, bụzị nnọọ okwu a kpụ n’ọnụ na Benue Steeti ugbua.

Ya bụ ụkọchukwu agbatalarị akwụkwọ mmasị na pati APC.

Cheta na ndị APC kwuru na akwụkwọ mmasị iso zọọ ọkwa Gọvanọ na pati ha bụ nde naịra iri ise (N50 million) ka ha na-ere ya.

Okwu a na-agba ọtụtụ mmadụ gharịị maka na iwu ụka Katọlik machiri ndị ụkọchukwu ịbanye otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla.

Ọtụtụ na-ajụ ajụjụ ebe ya bụ ụkọchukwu si weta nde naịra iri ise oji zụta akwụkwọ mmasị ndị APC, n’agbanyeghị na ọ naghị arụ ọrụ.

Mana ụfọdụ ndị ọzọ na Benue Steeti na-ekwu na obi dị ha mma etu ụkọchukwu a si pụta ịzọ ọkwa ọchịchị.

Onye bụ Fr Hyacinth Alia?

  • Ọ bụ onye obodo Mbangur, Mbadede, nke dị n’okpuru ọchịchị Vandeikya n’Steeti Benue
  • A mụrụ ya n’afọ 1966 ma chie ya ụkọchukwu n’afọ 1990
  • Ọ na-arụ ọrụ na dayọsis Gboko nke dịkwa na Benue Steeti
  • O nwere nzere ọkaibe na ngalaba agụmakwụkwọ dị icheiche dịka: Philosophy, Theology, Religious Education, nakwa Biomedical Ethics
  • Ọ rụrụ ọrụ n’ọtụtụ ụlọụka nakwa ụlọọgwụ na mba Amerịka nakwa Naịjirịa
  • O kwuru na ya nwere ọkpụkpọ oku “ịkpọpụta ụmụ Chineke n’ọchịchị nchigbu ha na-agabiga na Benue Steeti”

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nke a

Ihe ndi mmadú maka Fr Hyacinth Alia

Na soshal midia. ọtụtụ na-ekwu na ha chọrọ ka ụkọchukwu a pụta zọọ ọchịchị

Otu onye na mpaghara ahụ aha ya bụ Desomnd Amanyi gwara ndi ntaakụkọ Igbo na ụkọchukwu Hyacinth Alia nwere ọtụtụ ndị nkwado.

O kwuru na ọtụtụ na-enwe aṅụrị dịka ọ pụtara ịzọ ọkwa gọvanọ na Benue Steeti.

“Ọ bụrụ na o merie ntuliaka imeụlọ ndị APC mụ onwe m ga-atụnyere ya vootu,” Amanyi kwuru.

“Maka na ọchịchị ọjọọ akarịala na steeti anyị. Ọtụtụ mmadụ nwere nchekwube n’ebe ụkọchukwu a nọ.”

Gbasara etu o si nweta nde naịra iri ise o ji zụta akwụkwọ mmasị ndị pati APC, Amanyi kwuru na o chere na ọ bụ site na nkwado ndị mmadụ.

O kwuru sị: “Ụkọchukwu a abụghị obere mmadụ na Benue Steeti, ọ bụ nnukwu onye a ma ama. Ọ gbaghị m gharịị na ndị mmadụ nwereike ịkwado ya ịzụta ya bụ akwụkwọ.”

Ụdị ihe a o meela mbụ na Naịjirịa?

Fr Moses Adasu bụ Gọvanọ Benue Steeti malite n’afọ 1992 ruo 1993.

Nke a abụghị nke mbụ onye ụkọchukwu Katọlik na-azọ ọkwa ọchịchị na Naịjirịa.

N’afọ 1992, ụkọchukwu aha ya bụ Moses Orshio Adasu, zọrọ ma merie ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Benue Steeti.

Ọ bụ ụkọchukwu Adasu bụ Gọvanọ nke abụọ na Benue Steeti banyere n’ọchịchị site n’usoro ntuliaka.

O meriri ntuliaka ya n’otu ‘Social Democratic Party’ (SDP), ma chịa Benue Steeti ruo afọ 1993 oge ndị agha weghaara ọchịchị n’ike na Naịjirịa.

Moses Adasu lara mmụọ n’ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2005.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *