Take a fresh look at your lifestyle.

Ụmụakwụkwọ iri na ise gara ule JAMB efughị efu – Ndị uweojii Imo steeti

0 84

Ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti ewepụtala ozi gbasara ụmụakwụkwọ iri na ise a sị furu oge ha gara ule JAMB na mpaghara Ọkigwe.

Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye wepụtara n’ụbọchị Sọnde 18 Mee 2025 kwuru na enweghị oge ọbụla a tọọrọ ụmụakwụkwọ ahụ si n’ụlọakwụkwọ Eminent Scholars Imperial Academy dị n’Ọnịcha, Anambra steeti.

Dịka ozi ahụ siri kwuo, ha bụ ụmụakwụkwọ na onye nwe ụlọakwụkwọ ha rutere Imo steeti n’udo n’ụbọchị iri na isii  nke onwa Mee 2025 ma leekwa ule ha dịka e siri hazie ya.

Okoye kwuru na ọ bụ oge ụmụakwụkwọ ahụ na-ala ka ụgbọala ha mebiri na mpaghara Amuro dị n’Ọkigwe, bụ ebe ikuku nzirịtaozi na-adịghị.

Ọ sịrị na ọnọdụ ahụ gbochiri mkparịtaụka n’etiti ụmụakwụkwọ ahụ na ndị nwe ha, bụ nke mere ụfọdụ mmadụ jiri fesaa ozi ụgha na soshal midịa gbasara nchekwa ha.

“Oge anyị natara ozi ahụ, ndị uweojii Imo steeti na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ gbapụrụ ọsọ chọta ụmụakwụkwọ ahụ ma duru ha bata n’Owere”.

“Dịka e dozichara ụgbọala ha, ụmụakwụkwọ ahụ na onye nwe ụlọakwụkwọ ha bidokwara njem ha ma laruo Ọnịcha n’ụbọchị iri na asaa nke onwa Mee 2025 na-enweghị nsogbu,” ka Okoye kwuru.

Ọ gara n’ihu kelee ọhanaeze maka ezi mmetụta ha ma nye ndụmọdụ ka onye niile wepụ aka n’ifesa akụkọ ụgha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *