Onye nnọchianya Saụt Sudan na Vatịkan agwala ndị ndu mba ahụ mkpa ọ dị ịkwụsị agha iji kwanyere Popu Francis ugwu.
Achịbishọp Séamus Patrick Horgan kwuru na, “Anyị ga-agba mbọ ịhụ na anyị gosipụtara ezigbo udo na ndụ ndị Saụt Sudan, na-achọsi ike ịhụ ezi udo na-adịgide adịgide, ya n’inwe mkparịtaụka dịka ọnọdụ udo ahụ na ịhụ na-enwere nkwụsị nke ngwa agha.”
Cheta na mgbe Popu Francis nwụrụ anwụ gara njem nleta na Saụt Sudan n’afọ 2023, ọ gbara ndị ndu mba ahụ ume ma rịọ ka akwụsị agha.
Mana ime ihe ike n’oge na-adịbeghị anya na-eyi ịkwụsị nkwekọrịta udo na-esighị ike nke ha nwere n’afọ 2018 egwu.
E nwere nkwekọrịta nkwụsị agha n’etiti otu dị iche iche na mba ahụ dị n’ọwụwa anyanwụ Afrịka nke na-alụ agha obodo.
Esemokwu bilitere na mbido ọnwa Maachị nke 2025, mgbe otu ndịagha nnupụisi na osote onyeisiala Riek Machar jikọrọ aka n’oge agha obodo Saụt Sudan na ndịagha mba ahụ na-enwe nsogbu.
Cheta na Onyeisi ụlọọrụ UN na Saụt Sudan Nicolas Haysom dọrọ aka na ntị na mba ahụ nwereike ilaghachita n’agha obodo.
Archbishọp Horgan kwuru na Popu Francis “kwusiri okwu ike” mgbe ọ gara nleta na 2023, na-akpọ oku maka “nkwụsị ịkwafu ọbara, ọgbaghara, ime ihe ike”, na-agbakwụnye na ozi pontiff nwụrụ anwụ ka “dị mkpa”.
Leave a Reply