Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmentị kwuru na ha chọrọ ịkwalite ngwaahịa ndị a na-arụpụta na Naịjirịa

Chigo deziri ya n'Igbo

0 29

N’afọ 2025, gọọmentị Naịjirịa kwuru na ha ga-agwa ụlọakụ etiti ka ha kwụsị inye ndị na-azụahịa ego dọla maka iji ebubata ngwaahịa si na mba ọzọ.

Gọọmentị kwuru na ha chọrọ ịkwalite ngwaahịa ndị a na-arụpụta na Naịjirịa. Ngwaahịa ndị a gụnyere;

  • Nnụnụ dị ndụ maọbụ nke e gburu egbu, gụnyere anụ ọkụkọ e gburiri egburi.
  • Anụ ehi na nke ezi
  • Akwa ọkụkọ
  • Mmanụ e ji esi nri
  • Shuga (ọtọbịrịbịrị)
  • Mmanụ koko bọta
  • Spageti na pasta ụmụaka
  • Tomato ndụ maọbụ nke mkpo
  • Mmanya ndị dị na katọn nwere mkpụrụosisi n’ime ha
  • Mmiri na mmanya ndị gbara na mkpo
  • Sementi a rụrụ arụ
  • Ọgwụ
  • Ọgwụ ndị mebiri emebi
  • Fetịlaịza ọ gbara ọhụrụ (NPK 15-15-15)
  • Ncha na ọgbọ ụfụfụ e hi asa akwa
  • Ọgwụ e ji egbu anwụnta (Leko rope)
  • Ụkwụ ‘tire’ ụgbọala ochie
  • Kadbọd na akwụkwọ ndị e ji ese ihe
  • Kapet na rọgụ
  • Akpụkpụ ụkwụ, akpa na igbe
  • Karama ndị buru ibu karịa 150ml
  • Igwe ntụoyi mere ochie
  • Ụgbọala ndị karịrila afọ iri na abụọ
  • Mkpịsị e ji ede ihe

 

BBC IGBO

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *