Take a fresh look at your lifestyle.

EFCC nwụchiri  Ahmed Idris maka ebubo imefu ego

0 630

Akụkọ na-akpọtụ ebe niile na Naijiria kemgbe abalị bụ nnwuchi ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission, (EFCC) nwụchiri odebeego ukwu Gọọmentị Etiti n’ubochi Monde.

Ụlọ ọrụ EFCC nwụchiri Ahmed Idris maka ebubo imefu ego karịrị ijeri naịra iri asatọ (N80billion).

Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwajuren kwuru n’mgbasaozi o binyere aka, a nwụchiri Idris n’ihi na ọ jụrụ ịza oku ndị EFCC kpọrọ ya ugboro ugboro ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ebubo a.

Ọ kọwara na akatamkpo ego ahụ bụ ego gọọmentị nke Idris ji ụzọ mpụ na nrụrụaka dị iche iche nyefee onwe ya.

Ha kwuru a Idris ji ego ahụ zụọ ọtụtụ ụlọ na Kano nakwa Abuja n’aha ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya.

Onye bụdị Ahmed Idris?

  • Idris bụ onye onyeisiala Muhammadu Buhari họrọ n’ọrụ nabalị iri abụọ na ise nke ọnwa Juun afọ 2015 dịka ọ chụchara Jonah Ogunniyi Otunla maka ebubo imefu ijeri Naira abụọ na ụma ise ego nchekwa.
  • Buhari họkwara ya n’ọrụ ọzọ n’afọ 2019 ka o nwetara mmeri ịchị agba nke abụọ n’afọ 2019.
  • Idris bụbụ diretọ na ministri na-ahụ maka igwipụta ọnatarachi n’ala na igwe.
  • A ma Idris dịka onye danyela n’ọtụtụ okwu na ụka; ụka metụtara ịnọfe afọ ole o kwesịrị, mmefu ego na ịgha ụgha.
  • Idris alaghị ezumike nka ka o gbara afọ iri isii n’ọnwa Novemba afọ 2020 dịka iwu ọrụ oyibo Naijiria siri kwuo mana onyeisiala hapụrụ ya n’ọkwa ya
  • N’ọnwa Eprelụ, afọ 2021, otu na abụghị nke gọọmentị a kpọrọ “Socio-Economic Rights and Accountability Project (SERAP) degara Ọkaiwu Ukwu nker Gọọmentị eakwụkwọ na-arịọ ka enyocha Idris maka ego ruru ijeri ₦106 a na-achọ achọ bụ ego a mapụtara na bọjet afọ 2018 maka mịnịstri na ngalaba dị iche iche.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *