Etu e si lie ụmụaka atọ ahụ si n’otu ezinaụlọ e gburu ma tinye ozu ha n’igwe njụoyi n’Anambra Steeti
Akwa na ọnụ jụpụtara n’obodo Uga dị n’okpuruọchịchị Aguata nke Anambra Steeti mgbe a na-eme olili ụmụaka atọ ahụ si n’otu ezinaụlọ e gburu ma tinye ozu ha n’ime igwe njụoyi dị n’ụlọ ha.
E buuru ozu ụmụaka a aha ha bụ Chikaima dị afọ iri, Chimziterem dị afọ asatọ na Chimdirim dị afọ ise site n’ọbaozu nke ụlọọgwụ NAUTH dị na Nnewi ma gawa n’ụlọ nna ha dị n’obodo Uga ebe e liri ha.
Dịka e bu ozu ụmụaka ndị a na-alọta, ọtụtụ ndị mmadụ na-ebe akwa ma na-abụ ọnụ na “ọ gaghị adịrị onye ọbụla gburu ụmụaka a na mma.”
Ndị ndu ụlọụka St Michael Katọlik dị n’Umueze Uga, nke gụnyere ụkọchukwu na ndị sista haziri olile ụmụaka ndị a.
Cheta na ọ bụ n’ehihie ụbọchị Satọde 1 Febụwarị 2025 ka ndị maọbụ onye a na-amaghị gara n’ụlọ ụmụaka ndị a ma gbuo ha, were ozu ha tinye n’ime igwe njụoyi dị n’ụlọ ha.
Dịka ọ dị ugbua, a matabeghi onye maọbụ ndị kpara arụ a. Ndị uweojii kwuru na ha ka na-eme nnyocha.
Leave a Reply