Ime ihe mkpofu ka ọ bụrụ ohere akụ na ụba:Gọọmenti Naijiria.
Mịnịsta na-ahụ maka ụlọ ọrụ ahia na itinye ego, John Enoh kwuru na gọọmenti etiti ekwela nkwa itinye aka na mmejuputa na ngbanwee ihe mkpofu ka ọ bụrụ ohere akụ na ụba.
O kwuru na Naijiria nwere ikike ịzụlite ụlọ ọrụ nwere ọtụtụ ijeri dollar site na mkpofu
“Echeghị m na a ga-ewepụ ngalaba a. Kama, a ga-enye ya ike. Ọ bụrụ na anyị guzobe ya ugbu a, anyị ga-enwe ndị na-anakọta ihe mkpofu ma were ya na-enweta ego .Nwamadi a gbadoro ukwu gbasara ugboala ochie nke a na-ebubata obodo a,nke sokwa na nnukwu ihe mkpofu.
”
Leave a Reply