Akụkọ ekwuola na mmadụ niile na-eme njem na ndị ọrụ ụgbọelu ahụ kụkpọrọ n’ọdụụgbọelu Toronto Pearson Airport dị na mba Kanada ji ndụ pụta.
Ozi si n’aka onye ọrụ Greater Toronto Airports Authority bụ Deborah Flint kwuru na obi dị ha aṅụrị na enweghị onye nwụrụ na njiji ahụ. O mere ka a mata na ọ bụ obere ahụ ka ụfọdụ mmadụ meruru.
Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na otu nwatakịrị na ndị okenye abụọ meruru nnukwu ahụ na njiji ahụ.
Foto gbara n’anwụ na soshal midia gosiri na ụgbọelu ahụ tụgharịrị chilie ụkwụ elu oge ahụ ọ kụkpọrọ.
Ọdụụgbọelu Toronto Pearson Airport kwuru na ụgbọelu ahụ bụ nke ụlọọrụ Delta Airlines Flight 4819 bu mmadụ 76 na-eme njem na ndị ọrụ 4, si Minneapolis abata Toronto oge ọ kụkpọrọ.
Deborah Flint toro ndị ọrụ gbatagbata maka mbọ ha gbara ma kwuo na e bugara mmadụ 18 ụlọọgwụ. Ọ gara n;ihu kwuo na n’ime mmadụ 80 nọ n’ụgbọelu ahụ, mmadụ iri abuo na abuo bụ ndị mba Kanada ebe mmadụ ndị ọzọ si mba ndị ọzọ dị iche iche.
Ụlọọrụ Transportation Safety Board of Canada ekwuolla na ha ezigala ndị ọrụ nnyocha n’ogige ahụ iji chọpụta ihe kpatara ọdachi ahụ.
Leave a Reply