Take a fresh look at your lifestyle.

Ọtụtụ mmadụ anwụọla oge ebe a na-egwuputa ọlaedo zere na Mali

0 257

Ihe ruru mmadụ iri anọ anwụọla oge ebe na-egwuputa ọlaedo zere na Kéniéba dị na mpaghara Kayes mba Mali ụbọchị Satọde.

Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị ahụ nwụrụ bụ ụmụnwaanyị n’ogige ahụ bụ ebe iwu na-akwadoghị ebe.

Otu onyeisi otu ndị na-egwuputa ihe ọnatarachi gwara ndị ntaakụkọ na ndị ahụ nwụrụ banyere n’ogige ahụ ndị na-egwuputa ihe ọnatarachi hapụrụ iji chọọ ọlaedo mana njiji jiri oge ogige ahụ zere ma gbuo ha.

A na-ekwu na nke a bụ ugboro abụọ ụdịrị ọdachi a na-eme na mba Mali n’ime izuụka atọ.

Cheta na mmadụ iri nwụrụ oge ide mmiri wakporo ebe a na-egwuputa ihe ọnatarachi n’ọnwa Jenụwarị 2025.

Ka ọ dị ugbua, amabeghị mmadụ ole nwụrụ n’ọdachi ahụ mere ụbọchị Satọde.

Mba Mali bụ mba kachasị emepụta ọlaedo n’ụwa niile.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *