Onye isi ala Bola Tinubu laghachiri Abuja.
Njem ofesi Onye isi ala Naịjirịa, Bola Tinubu, mere na France na South Africa iji kwado mmekọrịta diplomatik na akụnụba bu nke o loghachigoro na Abuja, isi obodo Naịjirịa.
Na Nọvemba 27 ka njem onye isi ala na France, malitere , mgbe onye isi ala France, Emmanuel Macron, kpọrọ ya, lekwasịrị ịgbakwunye mmekọrịta abụọ a. Mkparịta ụka ahụ gbasasịrị na ngalaba dị iche iche dị ka mmepụta nri, nchekwa, agụmakwụkwọ, ahụike, ndị ntorobịa, nnukwu mmụta, na mgbanwe ọkụ eletrik.
Cheta na onye isi ala Tinubu si France gara Cape Town, South Africa, iji duzie ọkwa nke iri na otu nke Nigeria-South Africa Bi-National Commission na bekee (BNC) ya na onye isi ala South Africa, Cyril Ramaphosa.
Kọmishọn ahụ, nke e guzobere na 1999, na-akwado mmekọrịta abụọ a na ngalaba dị iche iche dị ka ndọrọ ndọrọ, azụmahịa, na nchekwa.
Ọ bụ oge nke abụọ kọmishọn ahụ ga-ekwuputa na ndi ọkwa isi ala, mgbe oge mbụ ya e mere na Ọktoba 2019 na Pretoria.
Leave a Reply