Take a fresh look at your lifestyle.

Mmadụ isii anwụọla n’ụloelu dara n’ahịa Ọchanja n’Onitsha

0 194

Aka na-achị Anambara Steeti bụ Charles Soludo enyela iwu ka igwe niile e ji egwu ala dị n’Anambara gaba n’ahịa Ọchanja n’Ọnịcha ebe ọtụtụ ndị mmadụ tọrọ n’ime uzuzu n’ụlọelu dara n’ahịa ahụ ụbọchị Mọnde.

Soludo kwuru nke a oge ọ gara ileta ụdirị mbibi mere ebe ahụ ụbọchị Tuzde.

N’okwu ya, “agwala m kọmịshọna ọrụ ka o buta igwe ‘escavator’ niile di n’Anambara, site n’amara Chukwu, anyị ga-agbapụta mmadụ niile ka nọ n’ime ebe ahụ tupu chie ejie taa”.

Ndị nọ oge ihe ahụ mere kwuru na ọrụ na-aga n’ihu ebe ahụ ụtụtụ, ehihie na abalị.

N’okwu gọvanọ Soludo, “anụrụ m na ọ bụ ndị ọrụ onye na-arụ ụlọ ahụ gụnyere ndị na-arụ ọrụ abalị bụ ndị tọọrọ n’ime uzuzu ahụ, ihe a na-agba anya mmiri”

Ụloelu atọ n’ime ụlọahịa ‘plaza’ ise a na-arụ n’ahịa Odu Igbo n’Ochanja dị n’Ọnịcha n’Anambara Steeti adara na mgbede ụbọchi Mọnde abalị 26 ọnwa Febuwarị.

Ndị ọrụ gbatagbata National Emergency Management Agency NEMA agbapụtala mmadụ iri abụọ ebe mmadụ isii nwụrụla anwụ.

E burula mmadụ iri abụọ na isii ndị ahụ gaa n’ụlọọgwụ nakwa n’ụlọozu.

Ọtụtụ ndị mmadụ ka tọrọ n’okpuru uzuzu ahụ ebe ndị ọrụ gbatagbata ka na-aga n’ihu ịgbapụta ha.

Ụlọelu ahụ bụ ndịisi ahịa ọchanja nyere otu onye na-arụ ụlọ ọrụ ahụ.Ụlọelu atọ n’ime ụlọelu ise a na-arụ n’ọchanja dara

Ihe Gọọmentị Anambara kwuru

Aka na-achị Anambara Steeti bụ Chukwuma Charles Soludo agaala leta ụdị mbibi mere ebe ahụ ụlọelu dara n’ahịa Ọnịcha.

O bere arịrị n’ụdị mkpamkpa kpara ebe ahụ ma kwuo na ụdị ihe ahụ ekwesighi ime.

N’okwu ya, “aga m agba m mbọ hụ na ndị na-arụ ụlo adigboroja ga-anata ntaramahụhụ so ya.”

Ọ gara n’ihu kwuo “ndị rụrụ ụlo adịgboroja a ga-eji aka ha bịa kutuo ụlọọrụ adịgboroja ha rụrụ”.

Anyị ka na-ewetara gị akụkọ a dịka ọ na-aga n’ihu.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *