Take a fresh look at your lifestyle.

Tarị Naịra 3.3 Tinubu kwadoro maka ngalaba ọkụ latrik, ọ ga-eme ka ọkụ na-enwu oge niile?

0 82

Onyeisiala Bola Tinubu akwadola atụmatụ iji kwụchapụ ụgwọ niile e jikọrọ ngalaba na-ahụ maka ọkụ latrik, site n’ihe omume a kpọrọ Presidential Power Sector Financial Reforms Programme.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Bayo Onanuga mere ka anyị mata nke a n’ozi o wepụtara n’ụbọchị Sọnde 5 Eprel 2026.

Onanuga kọwara na atụmatụ a gbasoro nnyochagharị akatamkpo ụgwọ e jikọrọ ngalaba ọkụ latrik kemgbe ihe karịrị afọ iri.

Dịka o siri kọwaa, gọọmenti jikọrọ ụgwọ ndị ahụ n’agbata Febụwarị 2015 na Maachị 2025.

Ọ sịrị na dịka ha mechara nnyocha, ha kwekọrịtara ịkwụ tarị Naịra atọ na ụma atọ (N3.3tr) iji weta okwu ahụ na njedebe.

Bayo Onanuga kwuru na a malitela ịkwụ ụgwọ ahụ, dịka ụlọọrụ ọkụ latrik iri na ise binyere aka na nkwekọrịta ọnụego ya dị tarị Naịra abụọ na ụma atọ (N2.3tr).

O mere ka a mata na Gọọmenti Naịjirịa amawapụtalarị narị ijeri Naịra ise na otu (N501bn) iji kwado ụgwọ ndị a.

Onanuga kwukwara na e kesaala narị ijeri Naịra abụọ na iri abụọ na atọ (N223bn) n’ime ego ahụ, dịka a ga-agakwa n’ihu na-akwụ ụgwọ ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *