Take a fresh look at your lifestyle.

Ụmụakwụkwọ 13 anwụọla mgbe bọs na gwongworo kụkọtara na mba Saụt Afrịka

0 160

Ụmụakwụkwọ iri na atọ anwụọla na mba Saụt Afrịka mgbe obere bọs ha ji na-eme njem kụrụ gwongworo na ndịda obodo Johannesburg.

Ndị ọrụ agụmakwụkwọ mpaghara ahụ kwuru na ihe mberede ahụ mere n’ụtụtụ Mọnde n’ihe dịka ọ kụrụ elekere asaa nke ụtụtụ na Vanderbijlpark.

E kwuru na ụmụakwụkwọ iri na otu nwụrụ n’ebe ihe mberede ahụ mere, ebe mmadụ abụọ nwụrụ n’ihi mmerụ ahụ ha nwere. Mana ụmụakwụkwọ abụọ ndị ọzọ ka nọ n’ọnọdụ dị oke njọ.

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Mavela Masondo kwuru na onye ọkwọ ụgbọala obere bọs ahụ daranyere n’ụgbọala ahụ mgbe ọ nwara ịgafe ụgbọala abụọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *