Gọọmenti Etiti akpụpụla onye na-ahụ maka ikike mmadụ bụ Omoyele Sowore n’ulọikpe ọzọ dabere n’ebubo abụọ e megharịrị emegharị.
Ha boro Sowore ebubo ịkpaarị Onyeisiala Bola Tinubu n’ịntaneetị, mana ọ gọrọ agụgọ ma kwuo na aka ya dị ọcha.
Oge a na-elebagharị okwu ahụ anya n’Ụlọikpe Etiti, Ọkaiwu na-ekwuchitere DSS bụ Akinlolu Kehinde mere ka Ọkaikpe Mohammed Umar mata na ebubo ọhụrụ ndị ahụ wezugara X na Facebook dịka ndị ga-azara ọnụ ha ma hapụ naanị Sowore.
Ọkaiwu Gọọmenti Etiti gosiri njikere ọ dị ịmalite ikpe ahụ, mana Ọkaiwu Sowore bụ Abubakar Marshal gbara ụkwụ megide nke a ma kwuo na a gbakwunyeghị ozi onye akaebe n’ebubo ndị ahụ.
Ka o sina dị, Ọkaiwu DSS bụ Kehinde anabataghị nke a, dịka o kwuru na ọ gaghị abụ ihe ziri ezi iyigharị ikpe ahụ.
Mana dịka Ọkaikpe Mohammed nụchara nrụrịtaụka ndị Ọkaiwu ahụ, o yigharịrị ikpe ahụ ruo n’ụbọchị 22 Jenụwarị, 2026.
Leave a Reply