Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmenti Etiti akpụpụla Sowore n’ụlọikpe ọzọ

0 179

Gọọmenti Etiti akpụpụla onye na-ahụ maka ikike mmadụ bụ Omoyele Sowore n’ulọikpe ọzọ dabere n’ebubo abụọ e megharịrị emegharị.

Ha boro Sowore ebubo ịkpaarị Onyeisiala Bola Tinubu n’ịntaneetị, mana ọ gọrọ agụgọ ma kwuo na aka ya dị ọcha.

Oge a na-elebagharị okwu ahụ anya n’Ụlọikpe Etiti, Ọkaiwu na-ekwuchitere DSS bụ Akinlolu Kehinde mere ka Ọkaikpe Mohammed Umar mata na ebubo ọhụrụ ndị ahụ wezugara X na Facebook dịka ndị ga-azara ọnụ ha ma hapụ naanị Sowore.

‎Ọkaiwu Gọọmenti Etiti gosiri njikere ọ dị ịmalite ikpe ahụ, mana Ọkaiwu Sowore bụ Abubakar Marshal gbara ụkwụ megide nke a ma kwuo na a gbakwunyeghị ozi onye akaebe n’ebubo ndị ahụ.

Ka o sina dị, Ọkaiwu DSS bụ Kehinde anabataghị nke a, dịka o kwuru na ọ gaghị abụ ihe ziri ezi iyigharị ikpe ahụ.

Mana dịka Ọkaikpe Mohammed nụchara nrụrịtaụka ndị Ọkaiwu ahụ, o yigharịrị ikpe ahụ ruo n’ụbọchị 22 Jenụwarị, 2026.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *