Onyeisiala Bola Tinubu enyela ikike ka a malite atụmatụ igwupụta mmanụ agbidi na mpaghara Bauchi na Gombe Steeti nke a kpọrọ Kolmani Integrated Development Project.
Minista nta na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Sịnetọ Heineken Lokpobiri kwupụtata nke a mgbe ọ na-agbape ụlọakwụkwọ ebe a na-amụ maka mmanụ gaasị na agbidi dị na Bauchi Steeti dịka akwụkwọ onye ndụmọdụ ya bụ Nnaemeka Okafor wepụtara n’ụbọchị Sọnde si kwuo.
Ozi ahụ kwuru na atụmatụ a dị ezigbote mkpa iji wulite ngalaba mmadụ agbidi nke Naịjirịa.
Cheta na n’izuụka gara aga, Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Nigerian National Petroleum Company Limited (NNPCL) bụ Bayo Ojulari kwuru na ụlọọrụ ha ga-amalitekwa igwupụta mmanụ na mpaghara ugwu.
Gọvanọ Bauchi Steeti bụ Bala Mohammed kelere gọọmentị etiti maka ihiwe ụlọakwụkwọ ahụ ma kwuo na ha ga-agba mbọ hụụ na ụlọakwụkwọ ahụ mịtara ezi mkpụrụ.
Leave a Reply