Nyosom Wike bụbu Gọvanọ chiri Rịva steeti ma bụrụkwa mịnịsta na-ahụ maka Abuja ekwuola na ya enweghị mmasị ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2027.
Nyosom Wike kwuru nke a ma kọwaa na ya enweghị mmasị ịjiri otu Patị Peoples Democratic Party (PDP) nwere zọsa Onyeisiala Bola Tinubu ọkwa n’afọ 2027.
Cheta na tupuu a malite ntụlịaka Onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023, Nyesom Wike gbara mbọ ịzọ ọkwa Onyeisiala n’otu PDP mana Atiku Abubakar meriri ya ma jiri otu Pati ahụ zọọ ọkwa.
Kamgbe ahụ Wike kwuru na PDP emeteghị ya maka na ha nyere Onye mpaghara Ogwu Naịjirịa akọrọtọ ị jiri pati ha zọọ ọkwa Onyeisiala n’agbanyeghị na Mahamadu Buhari na-apụ n’ọkwa mgbe ahụ bụ onye ugwu .
N’oge ndi nta akuko gbara Wike ajụjụ ọnụ ka o kwuru na PDP enweghị ike ọbụla imeri na ntuliaka nke Onyeisiala n’afọ 2027 ma ọ bụrụ na ha emezighị ma hazie otu pati ha
Leave a Reply