A chọpụtala ọrịa kansa ‘prostrate’ n’ahụ Joe Biden bụbu Onyeisiala mba Amerịka dị afọ 82 dịka ozi si n’ụlọọrụ ya si kwuo. Ọrịa ahụ amụbawala ma ruo n’ọkpụkpụ ya.
Biden onye rịturu n’ọkwa ọchịchị n’ọnwa Jenụwarị a mana e nyochapụtara ọrịa a n’ụbọhị Frịade dịka ọ hụchara onye dọkịnta mana nsogbu ịnyụ mamịrị.
Ọrịa kansa bụ ọrịa dị ọjọọ nke ukwuu, a sị na ogogo nke ya ruru ihe dịka itoolu n’ime iri. Nke a pụtara na ọrịa a nọ n’ogogo dị elu na o nwere ikike ịgbasa ngwa ngwa dịka nnyocha ụlọọrụ Briten si kwuo.
Biden na ezinaụlọ ya na-atụgharị uche ụzọ dị iche iche e nwereike iji agwọ ya bụ ọrịa. Ụlọọrụ ya kwuru na e nwereike ịchịkwalata ya.
N’ozi ụlọọrụ Biden wepụtara n’ụbọchị Sọnde: “N’izu gara aga, a chọpụtara mkpụrụ kansa ‘prostrate’ n’ahụ Onyeisiala Joe Biden dịka dịka o nwere njirimaara nsogbu ịnyụ mamịrị.
“Na Fraịde, a chọpụtara na o bu ọrịa kansa prostrate nke ogogo ya ruru itoolu bụ nke bawanyere ruo n’ọkpụkpụ ya.
“Na-agbanyeghi na ogogo ọrịa a dị ukwuu ma dịkwa ọjọọ, ohere dị na e nwereike ịchịkwalata ya.”
Dịka ozi ahụ pụtachara n’ọha, Onye bụbu onyeisiala natara nkwado si n’ebe dị iche iche.
Onyeisiala Donald Trump dere n’akara soshal media ya ‘Truth Social’ na ya na nwunye ya bụ Melania Trump nwere “obi mwute mgbe ha nụrụ maka ọrịa Joe Biden.”
“Anyị na-ezigara Jill na ezinaụlọ ya ozi itiaka n’obi nakwa nkwado” ka o kwuru, dịka ọ na-arụ nwunye Biden bụ Jill Biden. “Anyị na-asị ka ha Biden gbakee ngwa ngwa.”
Kamala Harris bụbu osote onyeisiala mba Amerịka n’oge Biden zigakwara ezinaụlọ Joe Biden ozi nkwado ma kwuo na ọ na-ekpere ha ekpere.
N’otu aka ahụ Barack Obama bụbu onyeisiala mba Amerịka site n’afọ 2009 ruo 2017 kwuru na ya nwunye ya bụ Mitchelle na-etinye ezinaụlọ Biden n’ekpere.
Praịm Minista mba Briten bụ Kier Starmer depụtara na obi dị ya njọ mgbe ọ nụrụ maka ọrịa kansa Joe Biden ma kwuo na ọ na-ekpere ya na ezinaụlọ ya ekpere.
Leave a Reply