Ogbunigwe na-ada na Rọshịa, Yukren ka ọ fọrọ abalị abụọ ka nkwekọrịta ị kwụsịtụ agha ụbọchị iri ato bido
Mba Yukren na Rọshịa ka na-atụ onwe ha ogbunigwe aghara aghara ugbua na-agbanyeghị na ọ fọrọ naani abalị abụọ ka atụmatụ nkwekọrịta ị kwụsịtụ agha ụbọchị iri atọ nke mba Amerịka na-akwado bido.
Rọshịa tụrụ ogbunigwe na mpagahara Nọt Kharkiv dị na Yukren n’abalị nke mere ọkụ jiri gbaa ụlọ ahịa dị n’ebe ahụ.
Cheta na n’ọnwa Maachị ka Yukren nabatara nkwekọrịta ị kwụsịtụ agha ụbọchị iri atọ nke Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump wepụtara atụmatụ ya bụ nke a na-atụ anya na ọ ga-ebido n’abali asato nke onwa Mee, 2025.
N’aka nke ọzọ mba Rọshịa na-ekwu na Yukren tụrụ zipụrụ droonu ogbunigwe aghara aghara n’abalị bụ nke otu n’ime ya dara n’akụkọ ọdọ ụgbọelu dị n’isi mba ahụ bụ Mosko, mana ndị Yukren enwebeghị ihe ha kwuru maka nke a.
Cheta na mba Rọshịa wakporo mba Yukren n’ọnwa Febuwarị 2022 .
Ugbua mba Rọshịa enwerela mpaghara ala mba Yukren ruru pasenti iri abụọ.
Leave a Reply