Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmenti Steeti,Kebbi ekwuola na akwugo ụgwọ ọrụ niile nke ndị ọrụ.

Chigo deziri ya n'Igbo.

0 20

Nasir Idris Gọvanọ Steeti,Kebbi ekwupụtala na ọchịchị ya akwụla ụgwọ ọrụ niile nke ndị ọrụ, gụnyere ụgwọ ọnwa, onyinye ezumike, ụgwọ ezumike nka.

Na Birnin Kebbi na  mmemme ụbọchị  nke ndị ọrụ n’afo a ka o kwuru nke a.Gọvanọ kpughekwara na gọọmentị steeti ahụ ewepụtarala ụlọ narị abụọ maka ekesara ndị ọrụ iji gboo mkpa ụlọ ha.

Dị ka Gọvanọ Idris si kwuo, ịzụrụ ụlọ ndị ahụ bụ iji kwalite ọdịmma ndị ọrụ, na-eme ka ha nwee ike ịrụ ọrụ dị irè ma .

O gosipụtara afọ ojuju maka ezi mmekọrịta dị n’etiti gọọmentị steeti na otu ndị ọrụ, na-arịọ ka nke a gaba n’iru.

Gọvanọ ahụ gosipụtara ihe ndị ọchịchị ya rụzuru, gụnyere mmecha nke Ụlọ Ọrụ Ọchịchị nke ultra-modern, nke a na-atụ anya na onyeisi oche ga-enye ya.

Ọ kọwakwara na ọchịchị ya akwụsịla ịla n’iyi nke ndị ọrụ, ma tinye nnukwu ego n’agụmakwụkwọ, ọrụ ugbo na ngalaba ndị ọzọ maka ọdịmma mmadụ niile.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *