Take a fresh look at your lifestyle.

A kpụgaala nwoke a na-enyo enyo ụlọikpe maka ụgbọala gburu mmadụ iri na otu

0 76

E boro otu nwoke dị afọ iri atọ (30) ebubo igbu ọchụ mgbe ụgbọala ya kwọbatara ebe igwe mmadụ na-eme emume n’okporoụzọ dị na Vancouver nke Kanada, ma gbuo opekata mpe mmadụ iri na otu (11) ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ.

Ndị uweojii Vancouver kwuru na nwoke ahụ bụ Kai-Ji Adam Lo bi n’obodo ahụ batara n’ụlọikpe na mgbede ụbọchị Sọnde tupu ọ laghachi ụlọmkpọrọ. Ha kwukwara na a ga-ebo ya ebubo ndị ọzọ.

Onyeisi ndị uweojii Steve Rai kọwaara mwakpo ahụ mere ụbọchị Satọde mgbe a na-eme emume ụbọchị Lapu Lapu nke ihe ruru mmadụ otu narị puku (100,000) dịka ụbọchị kacha ọjọọ n’akụkọ obodo ahụ.

Ndị ọrụ gọọmentị ewepụtabeghị aha ndị nwụrụ anwụ, mana ndị uweojii kwuru na ọ bụ ndị dị afọ ise ruo iri isii na ise nwụrụ n’ihe mberede ahụ

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *