Take a fresh look at your lifestyle.

Vitali Klitschko:Ka udo were di mba Ukren nwere ike inye mba Rọshịa ala…

Chigo deziri ya n'Igbo

0 126

 Vitali Klitschko bụ Meyọ na-achị Kyiv   kwuru na mba Ukren nwereike inye mba Rọshịa ala maka udo.

O kwuru nke a dịka Onyeisiala mba Amerịka na-amanye ha ka ha kweta nwere ala nye ndị Rọshịa ka udo dị.

“Otu n’ime ihe nwereike ime bụ na anyị ga-enwepụ aka n’ala anyị. Ọbụghị ihe ka mma. Mana maka udo, udo nchereoge, o nwereike ọ bụrụ ihe ga-enweta udo, mana ọ gaghị adịgịde”.

Vitali sị na “mba Yukren agaghị anabata ọnọdụ ga-eme ka Rọshịa bụrụ ndị na-achị ha dịka ndị a dọorọ n’agha”.

Ọ mere ka amata nke a na nwantiti oge mba Rọshịa tụchara ogbunigwe gburu mmadụ iri abụọ ma meruo ọtụtụ ndị mmadụ ruru 80 ahụ na mpaghara Kyiv.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *