Take a fresh look at your lifestyle.

Zelensky akatọọla okwu Putin dịka Yukren na Rọshịa na-atụ onwe ha aka maka igbochi nkwa ‘nkwụsịtụ ọgụ Ista’

0 72

Rọshịa na Yukren na-ebo onwe ha ebubo igbochi mkpebi nkwa ‘nkwụsịtụ ọgụ Ista’ kwesiri ịnọ awa iri ato.

Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kọwara okwu Onyeisiala Putin na-achị Rọshịa dịka nke uru na-adịghị maka na e nweela mwakpo ruru iri anon a isii Rọshịa mere na Yukren kemgbe ụtụtụ a.

Mana mịnịsta Rọshịa na-ahụ maka nchekwa kwuru na ọ bụ mba Yukren tụrụ ogbunigwe ndí ahụ wakporo Yukren.

Cheta na Onyeisiala Putin nyere ndịagha ya iwu ka ha “kwụsị ọrụ agha niile” na Yukren maka nkwụsịtụ nwa oge, nke agha Yukren.

O kwuru nkwụsịtụ agha Yukren nke nwa oge nke awa iri atọ (30) ga-amalite n’awa nke isii na Rọshịa n’ụbọchị Satọde nwere ruu ime abalị ụbọchị Sọnde.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *