Take a fresh look at your lifestyle.

Popu pụtara n’Ista Sọnde mgbe ọrịachara ọrịa siri ike

0 77

Onyeisi ụka Katọlik n’ụwa niile Popu Francis apụtala maka inye ngọzị Ista Sọnde n’ogige St Peter dị na Vatican, ebe a na-akwado maka emume ahụ.

A maghị ma Popu ahụ dị afọ asatọ na asatọ (88) a ga-esonye ụka ụbọchị Ista n’ihi na ọ hapụrụ ụlọọgwụ n’ọnwa gara aga mgbe ọ nọchara izu ise iji nwete ọgwụgwọ maka ọrịa butere ya oyi baa okpukpu abụọ.

Oge ahụ, ndị dọkịta kwuru na ọ chọrọ ezumike ọnwa abụọ n’ụlọ ya. Tupuu emume nke ụbọchị Ista, a hụla Popu gburu abụọ n’izu a.

N’aka nke ọzọ, ọtụtụ puku ndị ụka Katọlik gbakọrọ na Rome maka ụka Ista bụkwa ụbọchị emume ncheta afọ iri abụọ na ise ‘jubilee year’ nke mere ka ọtụtụ nde mmadụ bịa n’obodo ahụ.

Emume ‘jubilee year’ na-amalite site na Popu imeghe ụzọ dị asọ na St Peter’s Basịlịka n’abali iri abuo na ano nke onwa Disemba.

Ndị ụka Katọlik kwenyere na-ịgafe ụzọ ahụ na-ewete mgbaghara mmeghe.

Cheta na kemgbe ọ ghọrọ popu n’afọ 2013, nke a bụ mbụ o sonyeghị n’ọtụtụ emume izu ụka dị asọ, gụnyere emume ụka abalị n’Ista Satọde na St Peter Basịlịka, dịka o nyefere ọrụ ya n’aka ndị Kadịnal.

Mana mgbe ọ pụtara na Basịlịka n’ụbọchị Ista, o kpere ekpere ma nyekwa ụmụaka ihe ụtọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *