Peter Obi bụbu Gọvanọ Anambra steeti ma bụrụkwa onye ji bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ patị zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023 na Gọvanọ na-achị Benue Steeti bụ Fada Hyacinth Lormen Alia enweela nghọtafe.
Mmadụ abụọ a were nghọtafe n’oge Peter Obi nyibere njem nleta na Benue Steeti nakwa Plateau steeti.
Na Plateau steeti, Peter Obi gara na Bokkos ga leta ndị ihe na-esiri ike maka ọnọdụ ndị ojiegbe tinyere ha ma nye ha ego nkwado.
Obi mechere gaa zute Gọvanọ na-achị steeti ahụ bụ Caleb Mutfwang tupuu ọ malite njem ị ga na Benue steeti bụ ebe nghọtafe siri dapụta.
Ọ bụ n’ụzọ ka Peter Obi na-aga Benue steeti ka ọ wetere ozi na-amaja obi si n’ụlọọrụ Gọvanọ Benue steeti bụ Fada Hyacinth Lormen Alia.
Ọzị ahụ sị na Gọvanọ Alia “amaghị na Peter Obi a ga-eji ndụ ya laa ma ọ bụrụ na ọ bịa na Benue steeti” bụ nke ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Benue steeti bụ Tersoo Kula kesere ndị ntaakụkọ.
Na nkọwa Peter Obi nyere n’akara X soshal mịdịa ya ka ọ sị na ya gbara mbọ ime ka Gọvanọ Benue mara na ya na-abịa, ebe ya na-aga na ihe ya ga-ime na steeti ahụ.
Obi si na ya enweteghị Gọvanọ Benue n’ekwentị mgbe niile ya kpọrọ ya ma kọwaa ihe gara n’etiti ya na onyeisi nchekwa Gọvanọ steeti ahụ bu onye mechere zitere ya ozi na-enyi egwu maka ndụ ya bụ nke ha kesere ndị ntaakụkọ.
N’okwu ya “e were m mmasị ị ga na n’ụlọakwụkwọ ndị nọọsụ Bishọp rụrụ na Gboko nakwa ogige ndị na-enweghị ụlọ maka ọgbaaghara mere na Benue steeti”
Leave a Reply