Kais Saied onye isi ala Tunisia chụrụ onye isi ala Kamel Maddouri n’oge ọgba aghara.
Chigo deziri ya n'Igbo.
Kais Saied onye isi ala Tunisia chụrụ onye isi ala Kamel Maddouri n’oge ọgba aghara. O mere nke a n’ihi maka mperi o riri n’ọrụ
Onye nọchiri ya buzi Sara Zaafarani onye bụ injinia ma bụrụ onye minista akụrụngwa na ụlọ kemgbe 2021. Ọ bụ praịm minista nke atọ Tunisia n’ihe na-erughị afọ abụọ.
Saied katọrọ nke ọma ọrụ nke minista ndị ozi, na-ekwu na ọtụtụ ndị emezughị ụkpụrụ achọrọ nakwa na atụmanya nke ndị Tunisia dị elu. N’ọnwa gara aga, ọ chụrụ onye minista na-ahụ maka ego Sihem Boughdiri.
Saied kpọrọ Zaafarani “ịkwado usoro gọọmentị ma gwaa ya ka o di ike n’oru.
Mkpesa banyere “ọrụ ọha na-emebi emebi” site na ahụike ruo na ụgbọ njem na akụrụngwa ka ndi Tunisia kpesaworo.Ha kwuru nke a na ndi omekaome juru ebe nile n’oru ohaneze .Oge eruola ịkwụsị ha ma mee ka onye ọ bụla na-arụ ọrụ na-aza ajụjụ.Oge erogokwa mgbe ha ga-eji mezi Tunisia.
Leave a Reply