Take a fresh look at your lifestyle.

APC toro ụlọ ọgbakọ omebe iwu maka ịkwado  ọnọdụ mberede onyeisiala kwuputala na steeti Rivas.

Hauwa Gidado, Abuja dere ya na bekee.

0 131

APC toro ụlọ ọgbakọ omebe iwu maka ịkwado  ọnọdụ mberede onyeisiala kwuputala na steeti Rivas

Otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) etoola ndị isi na ndị otu omebe iwu maka nkwado ngwa ngwa nke Onye isi ala Bola Ahmed Tinubu kwupụtara ọkwa ọnọdụ mberede mberede na steeti Rivers.

Felix Morka onye odeakwụkwọ mgbasa ozi ha  mere ka amata ya.O kwuru na Onye isi ala Tinubu ekwughachila nkwa ya n’ịhụ udo, idobe iwu na nchekwa na ichekwa akụ obodo dị oke mkpa na steeti Rivers, na ebumnobi kachasị bụ iweghachi usoro iwu.

 

N’ikwu okwu n’ihu Maazị Morka kwuru na “Anyị na-agba ndị Naijiria ume ka ha leghara ndị mmegide na-agba ọsọ anya na-achọ iji ọnọdụ dị na  Steeti Rivas mee ka esemokwu dị na mba ahụ.

N’ihi ya, Maazị Morka gbara ndị Naijiria ume ka ha kwado Onye isi ala Tinubu “na mbọ ọ na-agba iji nweta udo, chebe ndụ na ihe onwunwe ma mechaa weghachi ọchịchị iwu kwadoro na steeti ahụ.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *