Take a fresh look at your lifestyle.

Ngahari iwe na mba Bangladesh maka onwụ nwata edinara n’ike.

Chigo deziri ya n'igbo.

0 14

Ngahari iwe na mba Bangladesh maka onwụ nwata edinara n’ike.
Nwatakịrị  a dị afọ asatọ nke e dinara n’ike na Bangladesh anwụọla n’ihi mmerụ ahụ .Na Tọzdee, ka amalitere ngagharị iwe kpụ ọkụ n’ọnụ na mba ahụ.
N’etiti abalị   ka edinara nwata a ruo n’ụtụtụ echi ya,  mgbe ọ  jere eleta  nwanne ya nwanyị nke okenye dịka  nne ya siri kpesara a.
Di nwanne ya nwanyi na ndi ozo a na-ebo ebubo mere  nke a ka ejidere  ma tinye ya n’ụlọnga.
N’abalị Tọzdee, mgbe ha nụchara akụkọ banyere ọnwụ nwatakịrị ahụ, ndị mmadụ iwe ji rịdata n’ụlọ ndi a na-ebo ebubo mere ihe a ma, gbaa ya ọkụ.
“Ọ bụ ezie na ndị dọkịta jisiri ike mee ka ọnọdụ ahụ dị mana nwatakịrị nwanyị ahụ nwụrụ n’ihe dịka elekere 13:00 mpaghara (07:00 GMT) na Tọzdee ka ejidechara obi atọ, dịka nkwupụta sitere na ngalaba gọọmentị Inter-Services Public Relations (ISPR).

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *