Ụlọọrụ na-ebu agha emegide mpụ na nrụrụaka bụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) adọọla ahanaeze aka na ntị banyere ọrụ aka ụlọọrụ adịgboroja na Naịjirịa.
EFCC mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ozi ha bipụtara n’ịntaneti nakwa akara X soshal midia ha.
N’ozi ahụ, EFCC kwuru sị “n’usoro ikpochapu mpụ na nrụrụaka na ngaraba azụmahịa na ịchụnta ego mere anyị ji agwa ndị mmadụ ihe gbasara ndị na-anapụ mmadụ ego nakwa ụlọọrụ ha ji eme mpụ na nrụrụ aka”
“Ha na-eji ụzọ dị icheiche gunyere ịbipụta ụzọ e si akpata ego ma na-arịọ ndị mmadụ ka ha tinye ego ha ma were ya tụọ mgbere, mana ikpeazụ ha na-anapụ ndị ahụ ego ha”.
“Ụlọọrụ ndị ahụ edebenyeghị aha ha n’ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ (Central Bank of Nigeria, CBN) maọbụ n’aka ndị Security Exchange Commission, SEC bụ ụlọọrụ abụọ na-erekọta ngaraba azụmahịa ahụ”.
EFCC kwuru na CBN na SEC ekwetaghị na ụlọọrụ ndị ahụ debanyere aha ha n’ụlọọrụ ha abụọ n’oge ha juru ese banyere ụlọọrụ ahụ.
“Mana EFCC akpụpụla ọtụtụ n’ime ụlọọrụ ahụ n’ụlọikpe, ụlọọrụ ise n’ime ha ka ụlọikpe mara ikpe, ụlọọrụ ise ọzọ kwetere na ikpe mara ha, ebe a ka ga-ekpe ndị ọzọ ikpe”.
Leave a Reply